Olee Otú Ị Ga-esi Na-aza Ajụjụ A Jụrụ Gị?
1. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eṅomi Jizọs mgbe a jụrụ anyị ajụjụ?
1 Otú Jizọs si zaa ajụjụ ndị a jụrụ ya ka na-eju ndị mmadụ anya taa. Ọ ga-adị mma ma anyị ṅomie otú Jizọs si zaa ndị mmadụ ajụjụ ma a jụọ anyị ajụjụ n’ozi ọma.—1 Pita 2:21.
2. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịza ajụjụ a jụrụ anyị otú dị mma?
2 Buru Ụzọ Gee Ntị: Jizọs chebaara ihe mere e ji jụọ ya ajụjụ echiche. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ịjụ ajụjụ iji chọpụta ihe onye jụrụ gị ajụjụ bu n’obi jụọ ya. O nwere ike ihe onye jụrụ gị, “Ì kweere na Jizọs?” bu n’uche jụọ ya bụ ka ọ mara ihe mere na ị naghị agba Krismas. Ọ bụrụ na ị chọpụta ihe onye jụrụ gị ajụjụ chọrọ ịma kpọmkwem, ọ ga-eme ka ị zaa ya ihe ga-aka eru ya n’obi.—Luk 10:25-37.
3. Olee ihe ndị anyị nwere ga-enyere anyị aka ịchọta azịza ndị dị mma n’Akwụkwọ Nsọ?
3 Jiri Okwu Chineke Zaa Ya: Ọ na-akacha mma iji Baịbụl zaa mmadụ ajụjụ. (2 Tim. 3:16, 17; Hib. 4:12) Akwụkwọ Reasoning, akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, na “Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu” nke dị na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, enyerela ọtụtụ ndị aka ịza kpọmkwem ihe a jụrụ ha. Ọ bụrụgodị na onye jụrụ ajụjụ ahụ ekweghị na Baịbụl, i nwere ike iji akọ gwa ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Gbaa onye ahụ ume ka o chebara okwu amamihe dị na Baịbụl ezigbo echiche, bụ́ nke ọtụtụ ndị chọpụtarala na ọ bara uru. Ọ bụrụ na ị na-eṅomi Jizọs mgbe ị na-aza ajụjụ, azịza gị ga-adị “ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo ndị dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ”—ọ ga-adị ùgwù, maa mma, bakwaara onye ahụ ezigbo uru.—Ilu 25:11.
4. Olee oge anyị na-ekwesịghị ịzawa ajụjụ niile a jụrụ anyị?
4 Ànyị Kwesịrị Ịza Ajụjụ Niile A Jụrụ Anyị? Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ, ihere emela gị ịsị: “Amaghị m ya, ma m ga-eme nchọnchọ n’ajụjụ a ị jụrụ m, m ga-alọghachikwa gwa gị ihe m chọpụtara.” Mgbe onye nwe ụlọ hụrụ na ị naghị eme ka ị̀ maara ihe niile, hụkwa na i bu ọdịmma ya n’obi, ọ ga-ekwe ka ị bịa ọzọ. Ọ bụrụ na ị chọpụta na onye jụrụ gị ajụjụ bụ onye chọrọ ka gị na ya malite rụwa ụka, gbuo okwu gị nkenke dị ka Jizọs mere. (Luk 20:1-8) Ọ bụrụkwa na onye na-enweghị ezigbo mmasị n’eziokwu ahụ achọọ ka gị na ya rụwa ụka, mara otú ị ga-esi jiri akọ kwụsị nkwurịta okwu ahụ ma jiri oge gị chọwa ndị nwere obi eziokwu.—Mat. 7:6.
5. Olee ihe nlereanya Jizọs hapụụrụ anyị n’otú e si aza ndị mmadụ ajụjụ? (Gụọkwa igbe dị na peeji a.)
5 Jizọs maara na ọ dị oké mkpa ka ya tụkwasị Jehova obi iji nwee ike rụchaa ọrụ ya, nke bụ́ ‘ịgbara eziokwu àmà’ na ịza ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu ajụjụ ndị ha jụrụ ya. (Jọn 18:37) Ọ bụụrụ anyị nnọọ ihe ùgwù iṅomi Jizọs ma na-aza ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” ajụjụ ndị ha jụrụ anyị!—Ọrụ 13:48.
Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche
◼ Na-ege ntị nke ọma ka i nwee ike mata kpomkwem ihe onye jụrụ gị ajụjụ chọrọ ịma.—Luk 8:18.
◼ Jiri Baịbụl na-aza ajụjụ a jụrụ gị. Akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịbụ aka ochie n’iji Akwụkwọ Nsọ aza ajụjụ.—Hib. 4:12.
◼ Jiri nghọta, umeala n’obi na olu ọma na-agwa ndị mmadụ okwu.—Kọl. 4:6.