Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/10 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Otú Ihe Ndị A Na-egere Egere Dị n’Ịntanet Ga-esi Baara Anyị Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2015
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 4/10 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Ndịàmà Jehova hà kwesịrị ikesara ndị ọzọ okwu ihu ọha ma ọ bụ okwu ndị ọzọ e tinyere na teepụ ma ọ bụ nke e si na teepụ depụta?

Okwu ihu ọha na okwu ndị ọzọ ụmụnna na-ekwu na-agba anyị ume. (Ọrụ 15:32) N’ihi ya, ọ dịghị njọ ime ka ndị ọzọ na-anọghị mgbe e kwuru okwu ndị ahụ mara ihe ndị e kwuru. Ebe ọ bụ na e nweela ọtụtụ ngwá elektrọniks ndị e mepụtara iji na-etinye ihe na teepụ, e nwere ike itinye okwu na teepụ ma kesaara ya ndị ọzọ n’egbughị oge. Ụfọdụ ndị nwere okwu ihu ọha na okwu ndị ọzọ ha tinyere na teepụ, ma ndị e kwuru ọtụtụ afọ gara aga. Ha na-enyekwa ha ndị ọzọ ka ha gere ma ọ bụkwanụ mepụtaghachi nke ha na-enye ndị enyi ha. Ndị ọzọ na-etinye okwu ndị ahụ n’Ịntanet ka onye ọ bụla chọrọnụ si ebe ahụ were ya.

N’eziokwu, o nweghị ihe o mere ma anyị tinye okwu na teepụ ma ọ bụrụ na anyị bu n’obi ige ya n’oge ọzọ ma ọ bụkwanụ ka ndị ọzọ n’ezinụlọ anyị gee ya. Ihe ọzọkwa bụ na ndị okenye nwere ike ịhazi ka e tinye okwu na teepụ maka ụmụnna ndị ọrịa ma ọ bụ nká na-anaghị ekwe bịa ọmụmụ ihe. Ma, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị na-ekwesịghị iji kesaara ndị ọzọ okwu ihu ọha ma ọ bụ okwu ndị ọzọ e tinyere na teepụ ma ọ bụ nke e si na teepụ depụta.

Ebe ọ bụ na ihe ọkà okwu ọ bụla na-ebukarị n’obi ekwu okwu bụ ihe ndị na-eme n’ókèala ọgbakọ ma ọ bụ na sekit, mmadụ nwere ike ịghọtahie ihe e kwuru n’okwu e tinyere na teepụ nye ya, n’ihi na ọ maghị ihe ndị na-eme n’ebe a nọ kwuo okwu ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na o nwere ike isiri anyị ike ịmata onye kwuru okwu ahụ na mgbe o kwuru ya, ka obi nwee ike isi anyị ike na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu nakwa na ọ dabara ná nghọta anyị nwere ugbu a. (Luk 1:1-4) Ikesa okwu ndị e tinyere na teepụ nwekwara ike ime ka ndị na-ege ya towe onye kwuru ya otú na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụkwanụ mee ka isi buwe onye kwuru ya.—1 Kọr. 3:5-7.

Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-arụsi ọrụ ike iji na-ewepụta nri ime mmụọ “ga-ezuru” anyị nakwa “n’oge kwesịrị ekwesị.” (Luk 12:42) Ọ bụ ha na-ahazi okwu ndị a na-ekwu n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na okwu ndị a na-egere egere, bụ́ ndị e nwere ike isi n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com nweta. Obi kwesịrị isi anyị ike na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na Òtù Na-achị Isi ya ga na-enye anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịdị ike n’okwukwe.—Ọrụ 16:4, 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya