Otú Ihe Ndị A Na-egere Egere Dị n’Ịntanet Ga-esi Baara Anyị Uru
1. E wezụga akwụkwọ ndị e biri ebi, olee ihe ọzọ magburu onwe ya anyị nwere?
1 Ọtụtụ ndị na-aga na jw.org agụ akwụkwọ anyị dị iche iche. (Ekli. 12:10) Ma, ị̀ kpọnyetụla ihe ndị a na-egere egere ndị dị ebe ahụ mbụ? Ime otú ahụ ga-eme ka i nwee ike ịna-egere ọtụtụ ihe ndị dị ebe ahụ. Olee uru ihe ndị a na-egere egere dị ebe ahụ ga-abara anyị?
2. Olee otú ihe ndị a na-egere egere ga-esi abara anyị uru?
2 Uru Ọ Ga-abara Anyị na Ezinụlọ Anyị: Ọ bụrụ na anyị na-egere Baịbụl, magazin anyị, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ anyị nwere a na-egere egere mgbe anyị na-aga njem ma ọ bụ mgbe anyị na-eme ihe ndị ọzọ, anyị ga-enwe ike iji oge anyị na-emekwu ihe bara uru. (Efe. 5:15, 16) Anyị nwewe ofufe ezinụlọ, anyị nwere ike ịkpọnye akwụkwọ anyị ji amụ ihe n’ígwè ma na-ele anya na nke e biri ebi. Anyị nwekwara ike ịkpọnye ya ma anyị mụwa ihe nke anyị. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị na-amụ asụsụ ọzọ. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmụta ịgụ ihe nke ọma.
3. Olee ndị anyị nwere ike ịkpọnyere ihe ndị a na-egere egere n’ozi ọma?
3 Uru Ọ Ga-abara Anyị n’Ozi Ọma: Ụfọdụ ndị na-agaghị enwe efe ịgụ akwụkwọ anyị nwere ike chọọ igere ya egere. Ndị ọzọ anyị nwere ike ịkpọnyere ya bụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ, ndị ọ ga-abụ ha nụ okwu Chineke n’asụsụ ha, ya eruo ha n’obi. (Ọrụ 2:6-8) N’obodo ụfọdụ, ịkọrọ ndị mmadụ akụkọ so n’omenala. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo dị na Chaịna, ndị mmadụ na-akọrọ ụmụ ha ihe niile gbasara omenala ha. Ha anaghị ede ihe ndị ahụ ede, kama ha na-eji naanị ntị ha egere ha. N’Afrịka, ọ na-atọkwa ọtụtụ ndị ụtọ ma e jiri akụkọ na-akụziri ha ihe.
4. Olee ajụjụ ụfọdụ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị gbasara iji ihe ndị a na-egere egere zie ndị mmadụ ozi ọma?
4 N’ókèala unu, ò nwere onye ị ma na-asụ asụsụ ọzọ nke i nwere ike ịkpọnyere ihe a na-egere egere n’asụsụ ya? Ò nwere onye ị ma i nwere ike izigara ihe a na-egere egere n’iimel? Ì nwere ike itinye ya na siidi nye ụfọdụ ndị nwere mmasị, nyekwa ha akwụkwọ ahụ nke e biri ebi? Ọ bụrụ na anyị etinye akwụkwọ, broshọ, magazin ma ọ bụkwanụ traktị anyị nke a na-egere egere na siidi ma nye ya mmadụ n’ozi ọma, anyị nwere ike ide ya n’akwụkwọ awa. Ihe ndị anyị nwere a na-egere egere ga-abara anyị uru mgbe anyị na-amụ ihe. Ọ ga-enyekwara anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma.—1 Kọr. 3:6.