Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb23 Mee p. 13
  • Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ihe Ndị A Na-egere Egere Dị n’Ịntanet Ga-esi Baara Anyị Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Nyere Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ị̀ Jụtụla Onwe Gị Ajụjụ Ndị A?
    Teta!—2019
  • Ha Nwetara Nri n’Oge Ụnwụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
mwb23 Mee p. 13
Foto ndị na-egosi: Ndị na-egere Baịbụl a na-egere egere. 1. Ebe otu nwanna nwoke nọ n’èzí ji ihe a na-akwụnye ná ntị na-egere Baịbụl a na-egere egere n’ekwentị ya. 2. Ebe otu nwaanyị na obere nwa ya nwaanyị gwara ihe na-akpọpụta ụda ka ọ kpọwa Baịbụl a na-egere egere. Ha jikwa Baịbụl ha na-ele anya n’ebe a na-agụ. 3. Ebe otu nwanna nwaanyị ji ihe a na-akwụnye ná ntị na-egere Baịbụl a na-egere egere n’ekwentị ya mgbe ọ nọ n’ụgbọala ọhaneze.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?

Gịnị bụ Baịbụl a na-egere egere? Baịbụl a na-egere egere bụ Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a gụrụ agụ ma mepụta ya ka a na-egere ya egere. Anyị ji nwayọọ nwayọọ na-ewepụtakwu ya n’ọtụtụ asụsụ. Otu ihe magburu onwe ya na Baịbụl a a na-egere egere bụ na e ji olu dị iche iche gụọ okwu onye nke ọ bụla a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. E jikwa ụda olu kwesịrị ekwesị gụọ okwu ndị ahụ ka a ghara ịghọtahie ihe Baịbụl na-ekwu.

Olee uru Baịbụl a a na-egere egere na-abara ndị na-ege ya? Ọ na-atọ ọtụtụ ndị na-ege ya mgbe niile ezigbo ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka akụkọ ndị dị n’Okwu Chineke dịkwuo ha ka ihe mere eme. Ha kwuru na otú ahụ e si jiri olu dị iche iche gụọ ihe onye nke ọ bụla a kọrọ akụkọ ya kwuru na-eme ka ọ dị ha ka hà nọ mgbe ihe ahụ a na-akọ na-eme, na-emekwa ka ha ghọtakwuo ihe e dere na Baịbụl nke ọma. (Ilu 4:5) Ọtụtụ ndị ekwuokwala na ige ya na-eme ka obi jụrụ ha ma ha chegbuwe onwe ha.​—Ọma 94:19.

Ịnụ ka a na-agụpụta Okwu Chineke nwere ike ịkpa ezigbo ike ná ndụ anyị. (2 Ihe 34:19-21) Ọ bụrụ na unu nwere Baịbụl a a na-egere egere nke zuru ezu ma ọ bụkwanụ nke na-ezughị ezu n’asụsụ unu, gbalịa mee ka ige ya soro n’ihe ndị ị na-eme mgbe niile ná ndụ gị.

LEENỤ VIDIO SI NA VIDIO BỤ́ OTÚ E SI AKWADEBE BAỊBỤL A NA-EGERE EGERE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Gịnị masịrị gị banyere otú e si emepụta Baịbụl a na-egere egere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya