Gịnị Ka Ndị Ọzọ Na-amụta n’Aka Gị?
1. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mụtara n’aka ya?
1 Jizọs sịrị: “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m.” (Mat. 11:29) O doro anya na Jizọs ji àgwà ọma ya na okwu ọnụ ya kụziere ndị mmadụ ihe. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mụtara n’aka ya? Ha hụrụ na ọ dị nwayọọ n’obi, nwee obiọma, hụkwa ndị mmadụ n’anya. (Mat. 8:1-3; Mak 6:30-34) Ha hụkwara na ọ dị umeala n’obi, ma ọ bụghị nke elu ọnụ. (Jọn 13:2-5) Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs so ya na-aga ozi ọma, ha hụrụ na ọ kụziiri ndị mmadụ eziokwu ahụ nke ọma nakwa na ike anaghị agwụ ya n’ọrụ a. (Luk 8:1; 21:37, 38) Mgbe anyị nọ n’ozi ọma, gịnị ka ndị ọzọ na-amụta n’aka anyị?
2. Olee otú ejiji na àgwà ọma anyị si eme ka ndị nwe ụlọ nwee mmasị n’ozi anyị?
2 Ndị Nwe Ụlọ: Ejiji ọma anyị, àgwà ọma anyị, na ezigbo mmasị anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ nwere ike ime ka ndị nwe ụlọ nwee mmasị n’ozi anyị. (2 Kọr. 6:3; Fil. 1:27) Ha na-ahụ na ihe anyị na-ekwu na-esikarị na Baịbụl. Ihe na-atọ ndị ọzọ ụtọ bụ otú anyị si ege ha ntị nke ọma ma ha na-ekwu okwu. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka ndị mmadụ gee ntị n’ozi Alaeze ahụ. N’ihi ya, echekwala na o nweghị uru ọ bara ime ha.
3. Gịnị ka ụmụnna anyị nwere ike ịmụta n’aka anyị?
3 Ụmụnna Anyị: Gịnịkwa ka ụmụnna anyị nwere ike ịmụta n’aka anyị? Ọ bụrụ na anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ozi anyị, ọ ga-eme ka ndị ọzọ na-anụkwa ọkụ n’obi n’ozi ha. Dị nnọọ ka a na-eji ígwè amụcha ígwè, otú ahụkwa ka ndị ọzọ si amụta izi ozi ọma nke ọma ma ha hụ otú anyị si ezi ozi ọma nke ọma. (Ilu 27:17) Ọ bụrụkwa na anyị na-edetu ihe banyere ndị nwere mmasị n’ozi anyị ma hụ na anyị na-agaghachi na nke ha n’egbughị oge, ọ ga-eme ka ndị ọzọ mụta ịna-eme otú ahụ. Ụmụnna anyị ga-amụta ezigbo ihe n’aka anyị ma ọ bụrụ na anyị na-ejezu ozi anyị.—2 Tim. 4:5.
4. Gịnị mere o ji dị mma anyị nọtụ mgbe ụfọdụ, anyị echebara otú anyị si akpa àgwà echiche?
4 Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị nọtụ mgbe ụfọdụ, gị echebara ihe ị na-eme na ihe ị na-ekwu echiche nakwa ihe àgwà gị na-akụziri ndị ọzọ? Àgwà ọma anyị na-amasị Jehova, ọ na-emekwa ka anyị nwee ike ikwu dị ka Pọl kwuru, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.”—1 Kọr. 11:1.