‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
1. Olee akwụkwọ anyị ga-amụ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ malite n’izu Mach 14?
1 N’izu Mach 14, 2011, anyị ga-amalite ịmụ akwụkwọ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. N’akwụkwọ a, a tụlere ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi otú ọ ga-abụ mmadụ na-agụ akụkọ ndị ahụ, ha ana-atọ ya ezigbo ụtọ. A kọwaghị amaokwu ndị dị n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi otu otu n’akwụkwọ a, kama a kọwara ihe ndị anyị ga-amụta n’akụkọ ndị ahụ, kọwaakwa otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi eme ihe ọ mụtara.—Rom 15:4.
2. Kọwaa ụfọdụ ihe ndị dị n’akwụkwọ Ịgba Àmà.
2 Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ahụ: Na peeji nke 2 n’akwụkwọ ahụ, Òtù Na-achị Isi dere akwụkwọ ozi na-eru n’obi iji gwa anyị uru ha chọrọ ka anyị rite n’akwụkwọ ahụ. Malite n’isi nke abụọ, e depụtara isi ihe a ga-eleba anya na ya n’isiokwu nke ọ bụla nakwa amaokwu ndị a ga-atụle n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. N’ọtụtụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a, e nwere igbe ndị e dere ihe ndị ga-enyere mmadụ aka. Igbe ụfọdụ kọwara ndị a kọrọ akụkọ ha n’Ọrụ Ndịozi, ebe ndị dị iche iche e kwuru okwu ha na ya ma ọ bụkwanụ ihe ndị mere eme a kọrọ na ya. Ihe mere e ji nye ohere buru ibu n’akụkụ peeji ndị dị n’akwụkwọ a bụ ka anyị nwee ike ide ihe ndị dị anyị mkpa mgbe anyị na-amụ ihe. N’isiokwu niile dị n’akwụkwọ ahụ, e sere ihe ndị na-egosi akụkọ ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, ka anyị nwee ike iji anya nke uche hụ otú ihe ndị ahụ a kọrọ si mee. E seghachiri ihe osise ndị dị n’akwụkwọ ahụ na peeji ikpeazụ, kọwaakwa ha. N’ime ihu mkpo akwụkwọ ahụ nakwa n’ime azụ mkpo ya, e sere map ndị ga-enyere anyị aka ịmata ebe dị iche iche ndị ohu Chineke ibe anyị na narị afọ mbụ gara mgbe ha ziri ozi ọma ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8.
3. Olee ajụjụ ndị dị mkpa a ga-aza ka anyị na-amụ akwụkwọ Ọrụ Ndịozi?
3 Azịza nke Ajụjụ Ndị Dị Mkpa: Ịmụ akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ga-enyere anyị aka ịghọta azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa a na-ajụ gbasara ozi ọma Ndị Kraịst na-ekwusa. Dị ka ihe atụ, olee ọrụ e ji mara ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, oleekwa ihe ha na-ekwusa? Ònye na-eduzi ọrụ nkwusa a a na-arụ n’ụwa niile, oleekwa otú o si eduzi ya? A kpagbuwe ndị na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụ megidewe ha, olee ihe ndị ha nwere ike iji oge ahụ mee? Olee ọrụ mmụọ nsọ na-arụ n’ozi ọma anyị na-ekwusa?
4. Gịnị ga-eme ka anyị rite ezigbo uru mgbe anyị ga-amụ akwụkwọ a n’ọmụmụ ihe?
4 Ka i nwee ike irite ezigbo uru mgbe a na-amụ akwụkwọ ahụ n’ọgbakọ, na-akwadebe ebe a ga-amụ tupu oge eruo, kwadebekwa ihe ị ga-aza ma a mụwa ya. Ahapụkwala ịbịa ọmụmụ ihe n’ụbọchị nke ọ bụla, gbalịakwa chee echiche otú ị ga-esi eme ihe ị mụtara ma ị gaa ozi ọma. Ka akwụkwọ a na-atọ ụtọ anyị ga-amụ kpalie anyị ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke!—Ọrụ 28:23.