Nwee “Obi Ọmịiko”
1. Gịnị ka ndị mmadụ chọrọ ka e gosi ha taa?
1 Kemgbe ụwa, o nwetụbeghị mgbe ụmụ mmadụ chọrọ ka e gosi ha obi ọmịiko karịa otú ha chọrọ ya ugbu a. Nsogbu ụwa a emeela ka obi ghara ịna-adị ọtụtụ ndị ụtọ. Obi na-ada ọtụtụ ndị mbà, ha enweghịkwa olileanya na ihe ga-emecha dị mma. Ọtụtụ nde mmadụ chọrọ ka e nyere ha aka. Ọ bụ ya mere anyịnwa bụ́ Ndị Kraịst ji kwesị imere ndị agbata obi anyị ihe ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya. (Mat. 22:39; Gal. 6:10) Olee otú anyị ga-esi eme ya?
2. Olee otú kacha mma anyị ga-esi egosi ndị mmadụ na ọmịiko ha na-eme anyị?
2 Ọrụ Na-egosi na Anyị Nwere Obi Ọmịiko: O nweghị onye ọ bụla ọzọ ga-akasi ụmụ mmadụ obi nke ọma ma ọ́ bụghị Chineke. (2 Kọr. 1:3, 4) Jehova gwara anyị ka anyị na-enwere ndị mmadụ “obi ọmịiko” otú ahụ yanwa na-enwere ha. Ọ gwakwara anyị ka anyị gakwuru ndị agbata obi anyị zie ha ozi ọma Alaeze ya. (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na anyị adị uchu n’ọrụ a, anyị ga-enwe ike ịkasi “ndị e tiwara obi” obi n’ihi na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ bie. (Aịza. 61:1) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ arụrụala niile dị n’ụwa a ma weta ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ya. Ihe mere ọ ga-eji eme ya bụ na ọmịiko ụmụ mmadụ na-eme ya.—2 Pita 3:13.
3. Gịnị ka anyị ga-eme iji gosi na anyị weere ndị mmadụ otú Jizọs si were ndị o ziri ozi ọma?
3 Were Ụmụ Mmadụ Otú Jizọs Si Were Ha: Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ziri ọtụtụ ìgwè mmadụ ozi ọma. Ya na-ezi ha ihe, ọ naghị ewere ha na ha bụ́ ìgwè mmadụ chọrọ ige ya ntị. Ọ na-ele onye ọ bụla n’ime ha anya ka onye ọ ga-enyere aka ka ya na Chineke malite ịdị ná mma. N’anya ya, ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Otú ụwa dị ha metụrụ Jizọs n’ahụ́, ọ bụ ya mere o ji nweere ha ndidi mgbe ọ na-akụziri ha ihe. (Mak 6:34) Ọ bụrụ na anyị ewere ndị mmadụ otú ahụ Jizọs si were ndị ọ kụziiri ihe, anyị ga-enwere onye nke ọ bụla n’ime ha ọmịiko. Otú anyị ga-esi na-agwa ha okwu na otú ọnụ ga-esi na-abụ anyị ọchị ọchị ga-egosi na anyị na-enwere ha ọmịiko. Ọ bụrụkwa na anyị na-enwere ndị mmadụ ọmịiko, mkpa anyị ga-abụ izi ha ozi ọma, anyị ga-agbakwa mbọ kwuo okwu anyị otú ọ ga-adaba ná mkpa ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere.—1 Kọr. 9:19-23.
4. Olee ihe mere anyị ji kwesị iyiri obi ọmịiko dị ka uwe?
4 Oké ìgwè mmadụ ndị si ná mba dị iche iche na-abata n’ọgbakọ n’ihi ozi ọma Alaeze a na-ezi ha taa. Obi dịkwa ha ụtọ na ndị ziri ha ozi ọma nwere ezigbote mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụrụ na anyị eyiri obi ọmịiko dị ka uwe, anyị ga-ewetara Jehova Chineke otuto ma mee ya obi ụtọ.—Kọl. 3:12.