‘Ka E Doo Aha Chineke Nsọ’
1. Gịnị bụ isiokwu mgbakọ sekit anyị nke afọ 2012, oleekwa ebe e si nweta ya?
1 Anyị nwere ezigbote ihe ùgwù n’ihi na a kpọkwasịrị anyị aha Jehova, bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ala. Ọ bụ Chineke kpọkwasịrị anyị aha ya. Kemgbe afọ 1931, ndị mmadụ jikwa aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova mara anyị. (Aịza. 43:10) Mgbe Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, bịara n’ụwa, o jighị aha Chineke gwuo egwu. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ihe mbụ o kwuru okwu ya n’ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 6:9) Ihe ahụ o kwuru ka e si nweta isiokwu mgbakọ sekit anyị nke afọ 2012, nke bụ́, “Ka E Doo Aha Chineke Nsọ.”
2. Olee ihe ndị anyị na-atụ anya ịnụ ná mgbakọ sekit na-abịanụ?
2 Ihe Ndị A Ga-ekwu: Na Satọdee, a ga-ekwu okwu isiokwu ya bụ: “Ndị Ozi Oge Niile—Na-emenụ Ka A Mara Aha Chineke.” N’isiokwu a, a ga-akọwa ihe mere ozi oge niile ji enye ọṅụ. A ga-enwekwa okwu mmadụ anọ ga-ekwu, nke isiokwu ya bụ: “Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ime Ihe A Ga-eji Kọchaa Aha Jehova.” N’isiokwu a, a ga-akọwara anyị ihe anyị nwere ike ime iji zere ụzọ ihe anọ Setan ji amata ndị mmadụ n’ọnyà. A ga-ekwukwa okwu ọzọ nke isiokwu ya bụ: “Ihe Mere A Ga-ejirịrị Doo Aha Chineke Nsọ.” E nwere ajụjụ abụọ a ga-aza n’isiokwu a, ha bụ: (1) Gịnị ga-eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma a sịgodị na ndị mmadụ enwechaghị mmasị n’ozi anyị? (2) Gịnị ga-enyere anyị aka iji ozi ọma anyị na-ekwusa kpọrọ ihe? Na Sọnde, anyị ga-anụ okwu mmadụ anọ ga-ekwu nke ga-eme ka anyị mata otú anyị ga-esi jiri ihe ndị anyị na-eche n’echiche, okwu ọnụ anyị, mkpebi ndị anyị na-eme, nakwa àgwà anyị na-edo aha Chineke nsọ. Ndị ọhụrụ ga-akacha enwe mmasị n’okwu ihu ọha a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ, nke isiokwu ya bụ: “Jehova Ga-edo Aha Ukwu Ya Nsọ n’Amagedọn.”
3. Olee ihe ùgwù Jehova nyere anyị, oleekwa uru ihe ndị a ga-ekwu ná mgbakọ sekit na-abịanụ ga-abara anyị?
3 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ihe iji hụ na e doro aha ya nsọ. (Ezik. 36:23) Ka ọ dịgodị, o nyere anyị ihe ùgwù iso ná ndị na-agba mbọ ido aha ya nsọ. Obi siri anyị ike na okwu ndị a ga-ekwu ná mgbakọ sekit na-abịanụ ga-enyere anyị aka ịhụ otú anyị ga-esi na-edo aha Chineke nsọ ebe ọ bụ na ọ kpọkwasịrị anyị aha ya.