Ì Nwere Ike ‘Ịgafe na Masedonia’?
1. Gịnị mere Pọl na ndị ya na ha so ji hapụ ebe ha chọburu ịga gawa Masedonia?
1 N’ihe dị ka n’afọ 49 O.A., Pọl onyeozi si Antiọk nke Siria gawa njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ. O bu n’obi ịga Efesọs na obodo ndị ọzọ dị n’Eshia Maịnọ. Ma, mmụọ nsọ gwara ya ka ọ hapụ ebe ndị ahụ ọ chọrọ ịga “gafeta na Masedonia.” Pọl na ndị ya na ha so ji obi ụtọ kweta ịga Masedonia, Chineke jikwa ha rụọ ọrụ nke na ha mechara hiwe ọgbakọ mbụ e nwere ná mpaghara ahụ. (Ọrụ 16:9, 10; 17:1, 2, 4) Taa, owuwe ihe ubi ahụ hiri nne, e nwekwara mba ụfọdụ a chọkwuru ndị ga-aga nye aka kwusaa ozi ọma. (Mat. 9:37, 38) Ì nwere ike ịga nye aka?
2. Olee ihe mere ụfọdụ ndị ji na-eche na ha agaghị agali mba ọzọ gaa kwusawa ozi ọma?
2 O nwere ike, ị ga-achọ ịbụ onye ozi ala ọzọ ka Pọl, ma, ọ gbatabeghị gị n’obi ịga kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na a gaghị akpọ gị ka ị gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied maka na i torubeghị ịga ya ma ọ bụkwanụ na i tofeela ya. Ihe ọzọ bụ na o nwere ike ịbụ na ị bụ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụkwanụ na ị ka na-azụ ụmụ. O nwekwara ike ịbụ na ịga kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ agbatabeghị gị n’obi n’ihi na i chere na ị gaghị amụtali asụsụ mba ọzọ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ebe i bi ugbu a abụghị mba unu, kama ị gara ebe ahụ ịkpa afọ gị, ị chọghịkwa ịkwaga ebe ọzọ. Ma, ọ bụrụ na i chebara otú ihe si dịrị gị echiche ma kpee ekpere banyere ya, i nwere ike ịchọpụta na ihe ndị ahụ ekwesịghị igbochi gị ịga nye aka ná mba e nwere mkpa ka ukwuu.
3. Gịnị mere ọ bụghị iwu na ị ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilied tupu i nwee ike ime nke ọma ma ị gaa ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ?
3 Ọ̀ Bụ Iwu na Ị Ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilied? Olee ihe mere Pọl na ndị òtù ya ji mee nke ọma n’ozi ọma ahụ ha gara kwusaa na Masedonia? Ọ bụ n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova na mmụọ nsọ ya obi. (2 Kọr. 3:1-5) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ị gaghị Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’ihi otú ihe si dịrị gị ugbu a, ị ka nwere ike ime nke ọma ma ị gaa kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ. Chetakwa na ihe omume ndị a na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa ná Nzukọ Ije Ozi na-akụziri gị otú ị ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma n’ebe ọ bụla ị gara. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied ma ọ bụkwanụ ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ, ịga kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ ga-eme ka ị mara otú ozi ala ọzọ na-adị. Ọ ga-emekwa ka ị mụta ihe ndị ga-enyere gị aka ma e mechaa kpọọ gị ka ị gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ.
4. Gịnị mere ndị merela okenye ekwesịghị iche na ha agaghị agali mba ọzọ gaa kwusawa ozi ọma?
4 Ndị Merela Okenye: Ndị merela okenye, bụ́ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma gbasie ike, nwere ike ịga nye aka ná mba ndị e nwere mkpa ka ukwuu. Ị̀ laala ezumike nká? Ndị a na-akwụ ụgwọ ezumike nká nwere ike iji ya lekọta onwe ha nke ọma ma ha gaa ikwusa ozi ọma ná mba ebe ihe na-esichaghị ike ka mba ha.
5. Kọọ banyere otu nwanna larala ezumike nká, bụ́ onye gara mba ọzọ ikwusa ozi ọma.
5 E nwere otu nwanna larala ezumike nká, ọ bụ okenye ọgbakọ na ọsụ ụzọ oge niile. O si mba a na-asụ asụsụ Bekee kwaga ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia, bụ́ ebe ndị mmadụ na-abịakarị elepụ anya. Ọ gara ebe ahụ inyere ndị nkwusa itoolu ji Bekee amụ ihe aka. Ndị nkwusa a na-ekwusara puku mmadụ iri atọ ozi ọma, bụ́ ndị mbịarambịa bi n’ebe ahụ. Ka ọ na-erule afọ abụọ nwanna ahụ gara ebe ahụ inyere ha aka, mmadụ iri ise bidoro bịawa ọmụmụ ihe. Nwanna ahụ kwuru, sị: “Eritetụbeghị m ụdị uru m riterela kemgbe m bịara ebe a. Agaghị m akọchali uru niile m riterela ebe a!”
6. Kọọ banyere otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, onye gara mba e nwere mkpa ka ukwuu ịga kwusaa ozi ọma.
6 Ụmụnna Nwaanyị Na-alụbeghị Di: Jehova ji ụmụnna nwaanyị arụ ọrụ dị egwu ma a bịa n’ikwusa ozi ọma ná mba ndị e nwere mkpa ka ukwuu. (Ọma 68:11) Otu nwa agbọghọ na-alụbeghị di chọrọ ịga kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ, ma, papa ya na mama ya nọ na-atụ ụjọ na ihe nwere ike ime ya ebe ahụ. N’ihi ya, o kpebiri ịga n’otu mba ndị ọchịchị na-anaghị enyekarị nsogbu, bụ́kwa ebe ihe na-esichaghị ike. O degaara alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ahụ akwụkwọ, ha agwa ya ihe ndị o kwesịrị ịma. Nwanna nwaanyị a nọrọ afọ isii ebe ahụ, Jehova gọzikwara ya. O kwuru, sị: “Mgbe m nọ ná mba anyị, enweghị m ọtụtụ ndị m na-amụrụ Baịbụl. Ma, mgbe m gara ebe e nwere mkpa ka ukwuu, enwetara m ọtụtụ ndị m mụụrụ Baịbụl. Amụtakwara m otú ka mma e si eduziri ndị mmadụ ọmụmụ ihe.”
7. Kọọ banyere otu ezinụlọ gara mba e nwere mkpa ka ukwuu gaa kwusaa ozi ọma.
7 Ndị Ka Na-azụ Ụmụ: Ọ bụrụ na ị ka na-azụ ụmụ, ọ̀ pụtara na ị gaghị agali mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma? E nwere otu di na nwunye gara mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma. Ha ji ụmụ abụọ, otu dị afọ iri, nke ọzọ adịrị afọ asatọ. Mama ha kwuru, sị: “Obi dị anyị ụtọ na anyị zụrụ ụmụ anyị ebe a, n’ihi na o mere ka ha na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị ozi ala ọzọ na-akpa. Ọbịbịa anyị bịara nye aka ebe a emeela ka Jehova gọzie anyị nke ukwuu.”
8. Mmadụ ò nwere ike ịga mba ọzọ kwusawa ozi ọma n’agbanyeghị na ọ maghị asụ asụsụ a na-asụ ná mba ahụ? Kọwaa.
8 Ịmụ Asụsụ Mba Ọzọ: Ọ̀ na-abụ i chewe echiche ịga kwusawa ozi ọma ná mba ọzọ cheta na ị ga-amụ asụsụ mba ahụ ike agwụ gị? O nwere ike ịbụ na e nwere ndị na-asụ asụsụ unu ná mba ndị ahụ a chọrọ ka ndị nkwusa gaa nye aka. Otu di na nwunye na-asụ Bekee gara mba a na-asụ Spanish ịga kwusaara ndị Bekee bi ebe ahụ ozi ọma. Ha bu ụzọ gwa alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ahụ ka ha nye ha aha ọgbakọ ndị ji Bekee amụ ihe, ndị nwere mkpa. Alaka ụlọ ọrụ ziteere ha aha ọgbakọ ndị ahụ, ha ahọrọ otu n’ime ha ma gaa soro ha mụọ ihe ugboro abụọ. Mgbe ha lọtara, ha selatara aka n’otú ha si emefu ego ma chekwaa ego otu afọ. Mgbe ha nwetatụrụ ego ha ga-eji aga, ha gwara ụmụnna ndị bi ná mba ahụ ka ha chọtara ha ụlọ ha na-agaghị akwụ oké ego.
9, 10. Olee ihe ndị si mba ha kwaga mba ọzọ nwere ike ime, ọ̀ bụkwa maka gịnị?
9 Ndị Mbịarambịa: Ị̀ nọ ná mba na-abụghị mba unu nata eziokwu ma ka biri ebe ahụ ugbu a? O nwere ike ịbụ na a chọrọ ndị ga-aga nye aka kwusaa ozi ọma ná mba unu. Ì nwere ike ịlaghachi mba unu gaa nye aka? O nwere ike ịdịrị gị mfe ịchọta ụlọ na ọrụ ná mba unu karịa onye si mba ọzọ bịa mba unu. Ọ ga-abụ na ị ma asụ asụsụ ndị obodo unu. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ nwere ike ịka gee gị ntị mgbe ị na-ezi ha ozi ọma karịa mgbe onye si esi bịa ziwere ha.
10 E nwere otu nwoke si Albenia gbaga ọsọ ndụ n’Ịtali. Mgbe o ruru ebe ahụ, o nwetara ezigbo ọrụ ma na-ezilara ndị ezinụlọ ya ego. Nwoke a mechara ghọọ Onyeàmà Jehova, bido ịkụziri ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche si Ịtali na-aga Albenia asụsụ Albenian. Ndị ọsụ ụzọ ahụ na-aga inye aka n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ná mba ahụ. Nwanna a kwuru, sị: “Ndị a na-aga ebe m si bịa obodo a. Ha amaghị asụ asụsụ anyị, ma, obi dị ha ụtọ ịga mba anyị. Mụnwa bụ nwa afọ Albenia, marakwa asụ Albenian, m̀ nọdị n’Ịtali a eme gịnị?” Nwanna a kpebiri ịlaghachi Albenia ịga nye aka kwusaa ozi ọma. O kwuru, sị: “Anatụdịghị m akwa ụta na m hapụrụ ọrụ na-enye m ezigbo ego n’Ịtali lawa Albenia. Ọrụ m na-arụ ugbu a bụ ọrụ kacha mkpa. Ihe doro m anya bụ na o nweghị ọrụ mmadụ ga-arụ ga-eme ya obi ụtọ n’ụwa a karịa iji ihe niile o nwere na-ejere Jehova ozi.”
11, 12. Olee ihe ndị chọrọ ịga mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma kwesịrị ime?
11 Otú Ị Ga-esi Eme Ya: Tupu Pọl na ndị òtù ya agawa Masedonia, ha chọburu ịga n’obodo ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ. Ma, ebe ọ bụ na “mmụọ nsọ machibidoro ha iwu,” ha gawaziri n’obodo ndị dị n’ebe ugwu. (Ọrụ 16:6) Mgbe ọ fọrọ obere ka ha ruo Bitinia, Jizọs gbochiri ha ịbanye ebe ahụ. (Ọrụ 16:7) Ruokwa taa, ọ bụ Jizọs ka Jehova ji na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma. (Mat. 28:20) N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ịga kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ, rịọ Jehova n’ekpere ka o nyere gị aka.—Luk 14:28-30; Jems 1:5; gụọ igbe dị na peeji nke 6. Isiokwu ya bụ: “Otú Ị Ga-esi Ama ma Mba Ị Chọrọ Ịga Kwusaa Ozi Ọma Ò Nwere Mkpa.”
12 Kọọrọ ndị okenye ọgbakọ unu na ndị ọzọ ji ofufe Jehova kpọrọ ihe na ị chọrọ ịga mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma, ka ị mara ihe ha ga-ekwu. (Ilu 11:14; 15:22) Gụọ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ anyị dị iche iche, bụ́ ndị kwuru banyere ịga kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ. Meekwa nchọnchọ, ka ị mara otú ihe si aga ná mba ahụ ị chọrọ ịga. I nwere ike ịga nọọ ihe dị ka otu izu ná mba ahụ ị chọrọ ịga, ka ị mara ma ị̀ ga-anọli ebe ahụ. I mechazie kpebie na ị ga-aga mba ahụ, i nwere ike ịchọta adres alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ahụ na Yearbook kacha ọhụrụ. Jiri adres ahụ degara ha akwụkwọ ozi ka ha gwa gị ihe ndị i kwesịrị ịma gbasara mba ha. I dechaa ya, nye ya ndị okenye ọgbakọ unu. Ha ga-ede obere ihe gbasara gị, jikọtazie ya na akwụkwọ ozi ahụ i dere ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ahụ.—Gụọ ihe e kwuru n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 111-112.
13. Olee ihe alaka ụlọ ọrụ ga-emere gị, ma olee ihe ndị ị ga-eji aka gị eme?
13 Alaka ụlọ ọrụ ahụ ga-ezitere gị akwụkwọ ozi, kọọrọ gị ihe ndị i kwesịrị ịma banyere mba ahụ ị chọrọ ịga. Nke a ga-enyekwara gị aka ikpebi ma ị̀ ga-aga ebe ahụ ka ọ̀ bụ na ị gaghị aga. Ma, ọ bụghị alaka ụlọ ọrụ ahụ ga-achọtara gị ụlọ, gbatara gị visa, ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ọ bụla ọzọ a na-enweta tupu a gafee mba ọzọ. Ihe ndị a bụ ihe ị ga-eji aka gị mee tupu ị gawa. Ọ bụkwa gịnwa ga-eji aka gị gakwuru ụlọ ọrụ na-anọchite anya mba ahụ ị chọrọ ịga ka ha kọọrọ gị ihe ndị i kwesịrị ime tupu e nye gị visa na akwụkwọ ikike ị ga-eji enweta ọrụ ná mba ahụ ị na-aga. Onye ọ bụla chọrọ ịga mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma kwesịrị ịdị njikere ịkpa afọ ya ebe ahụ na inweta akwụkwọ ikike niile gọọmenti chọrọ ya n’aka.—Gal. 6:5.
14. Olee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ná mba a na-ekwechaghị ka anyị na-ezi ozi ọma?
14 Mba Ndị A Na-ekwechaghị Ka Anyị Na-ezi Ozi Ọma: Ná mba ụfọdụ, ụmụnna anyị na-eji akọ eme ihe n’ihe ọ bụla gbasara ofufe Chineke. (Mat. 10:16) Onye nkwusa gara ụdị ebe ahụ nwere ike ọ gaghị ama mgbe ọ ga-eji mee ihe a ga-eji kpara ụmụnna anyị aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ụdị ebe ahụ, biko, buru ụzọ dee akwụkwọ ozi ma nye ya ndị okenye ọgbakọ unu ka ha zigara ya alaka ụlọ ọrụ.
15. Gịnị ka ndị na-agaghị agali mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma nwere ike ime?
15 Ọ Bụrụ na Ị Gaghị Agali: Ọ bụrụ na ị gaghị agali mba ọzọ gaa kwusa ozi ọma n’ihi otú ihe si dịrị gị, ya ewutela gị. E nwere ike imeghere gị ‘ọnụ ụzọ ọzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.’ (1 Kọr. 16:8, 9) Onye nlekọta sekit unu nwere ike ịma ọgbakọ dị gị nso, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu. I nwere ike ịga nyere ọgbakọ dị nso n’ebe i bi ma ọ bụ obere ìgwè na-eji asụsụ ọzọ amụ ihe aka. Ma ọ bụkwanụ gị ewepụtakwuo oge na-aga ozi ọma n’ókèala ọgbakọ unu. Ma ị̀ gara mba ọzọ kwusawa ozi ọma ma ọ̀ bụ na ị gaghị, ihe ka mkpa bụ: Jiri obi gị dum na-ekwusa ozi ọma.—Kọl. 3:23.
16. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwanna chọrọ ịga mba ọzọ gaa kwusaa ozi ọma?
16 Ò nwere nwanna ị ma ji ofufe Jehova kpọrọ ihe, bụ́ onye chọrọ ịga mba ọzọ kwusaa ozi ọma? Ya bụrụ na o nwere, nyere ya aka ma gbaa ya ume ka o mee ihe ahụ ọ chọrọ ime. Pọl hapụrụ Antiọk nke Siria gawa ebe ọzọ. Obodo ahụ ọ hapụrụ bụ obodo nke atọ kacha buo ibu n’Alaeze Ukwu Rom (ọ bụ naanị Rom na Alegzandria ka ya buo ibu), nke gosikwara na ókèala ha na-ezi ozi ọma hiri ezigbo nne. Ebe ha nwere nnukwute ókèala, ọ ga-abụ na Pọl ga-abara ha ezigbo uru ebe ahụ. N’agbanyeghị ya, Baịbụl ekwughị na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ahụ kụdara Pọl obi mgbe ọ chọrọ ịhapụ ha gawa ozi ọma n’ebe ọzọ e nwekwara mkpa. Kama ilekwasịwa anya naanị n’ókèala ha, ụmụnna ahụ chetara na “ubi ahụ bụ ụwa.”—Mat. 13:38.
17. Olee ihe mere anyị ji kwesị iche echiche ‘ịgafe na Masedonia’?
17 Jehova gọziri mbọ Pọl na ndị òtù ya gbara mgbe ha zara òkù ahụ a kpọrọ ha ịga kwusaa ozi ọma na Masedonia. Ọ bụ mgbe ahụ ha gara Filipaị, bụ́ obodo dị na Masedonia, ka ha hụrụ Lidia ma zie ya ozi ọma. Nke a mere ka ‘Jehova meghee obi ya ịnabata ihe Pọl nọ na-ekwu.’ (Ọrụ 16:14) Chegodị echiche otú obi dị Pọl na ndị òtù ya mgbe e mere Lidia na ndị ezinụlọ ya niile baptizim. Ị gaa ọtụtụ ebe n’ụwa, e nwere ndị nwere obi ife Chineke ka Lidia ma ya abụrụ na Ndịàmà Jehova abịabeghị zie ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ị ‘gafee na Masedonia,’ i nwere ike ịchọta ụdị ndị ahụ zie ha ozi ọma, obi ga-atọkwa gị ezigbo ụtọ.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Otú Ị Ga-esi Ama ma Mba Ị Chọrọ Ịga Kwusaa Ozi Ọma Ò Nwere Mkpa
• N’afọ ọ bụla, akụkọ ozi Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-agba n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Febụwarị. I were nke afọ a ma lee anya ebe ahụ e dere “Mmadụ Ole Otu Onye Nkwusa Ketara,” ị ga-eji ya ama ma mba ị chọrọ ịga ò nwere mkpa.
• Jiri akwụkwọ Index chọọ akwụkwọ anyị ndị e dere ahụmahụ na ihe ndị ọzọ gbasara otú ozi ọma si na-aga ná mba ahụ ị chọrọ ịga.
• Gbaa ndị nkwusa gatụrụla mba ahụ ajụjụ ọnụ ma ọ bụkwanụ ndị nke birila ebe ahụ.
• Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ná mba a na-asụ asụsụ unu, jiri Ịntanet ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ọ bụla kwuru gbasara mba ahụ mata mmadụ ole na-asụ asụsụ unu n’ebe ahụ.