Ị̀ Na-erite Uru n’Ihe Jehova Na-akụziri Anyị?
1. Olee ihe gosiri na Jehova bụ “Onye Ozizi Ukwu”?
1 Jehova bụ “Onye Ozizi Ukwu” anyị, ọ chọkwara ka anyị mara ihe. (Aịza. 30:20) Ọ malitere ịkụzi ihe ozugbo o kechara Ọkpara ya. (Jọn 8:28) Mgbe Adam nupụụrụ Chineke isi, ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ mere ka ọ nọgide na-akụziri ha ihe ndị ga-abara ha uru n’agbanyeghị na ha ezughịzi okè.—Aịza. 48:17, 18; 2 Tim. 3:14, 15.
2. Olee otú Jehova si na-akụziri ụmụ mmadụ ihe taa?
2 Taa, Jehova ji ọgbakọ ya na-akụziri ụmụ mmadụ ihe otú ọ na-akụzitụbeghị. N’ụwa niile, ọtụtụ nde ndị mmadụ na-enubata ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova’ otú ahụ Aịzaya buru amụma ya. (Aịza. 2:2) Gịnị mere ha ji enubata n’ugwu nke ụlọ Jehova? Ọ bụ ka Jehova kụziere ha ụzọ ya. (Aịza. 2:3) N’afọ ije ozi 2010, Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu ijeri awa na narị nde awa isii kụziere ndị mmadụ Baịbụl. Ihe ọzọ bụ na n’izu ọ bụla, a na-akụziri anyị Okwu Chineke n’ọgbakọ dị ihe karịrị otu narị puku na puku ise n’ụwa niile. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebipụtakwara anyị akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ ise.
3. Olee uru i riterela n’ihe Jehova na-akụziri anyị taa?
3 Kwe Ka Ọ Baara Gị Ezigbo Uru: Anyị na-erite uru na-enweghị atụ n’ihe Chineke na-akụziri anyị. Anyị amụtala na Chineke nwere aha nakwa na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. (Ọma 83:18; 1 Pita 5:6, 7) Anyị amatala azịza ajụjụ ụfọdụ ndị kacha echu ụmụ mmadụ ụra taa, ndị dị ka: Olee ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ? Olee ihe m ga-eme ka m nwee ike ịna-enwe ezigbo obi ụtọ? Gịnị mere Chineke ji kee anyị? Jehova akụziekwarala anyị ihe anyị ga-eme ‘ka ụzọ anyị na-aga nke ọma.’—Jọsh. 1:8.
4. Olee ụlọ akwụkwọ ndị e ji na-akụziri ndị Chineke ihe taa, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ịgba mbọ na-amụta ihe Jehova na-akụziri anyị?
4 Ihe ọzọ bụ na Jehova emeela ka e nwee ụlọ akwụkwọ dị iche iche ebe a na-azụ ọtụtụ ndị ohu ya ka ha nwee ike ijekwuru ya ozi. Na peeji nke 4-6, e depụtara ụfọdụ n’ime ha. Ọ bụrụgodị na anyị enwelighị ike ịga nke anyị gaara achọ ịga, n’ihi otú ihe si dịrị anyị, anyị kwesịrị ịgbalị jiri nke anyị na-agali kpọrọ ihe. Anyị kwesịkwara ịna-agba ndị na-eto eto ume ka ha gbalịa gaa ụlọ akwụkwọ ndị a Jehova ji na-azụ anyị kama ịgawa ụlọ akwụkwọ mahadum ndị nkụzi ha na-agwa ha gaa. Ị manụ na ihe Jehova ga-akụziri ha ga-akanyụ nke ụwa ga-akụziri ha anya. Ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike na-amụta ihe Jehova na-akụziri anyị, ndụ ga na-atọ anyị ụtọ ugbu a, anyị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.—Ọma 119:105; Jọn 17:3.
Ụfọdụ Ụlọ Akwụkwọ Nzukọ Jehova Wepụtara
Klas A Na-amụ Otú E Si Agụ na Otú E Si Ede
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ọ bụ ka a na-akụziri ndị mmadụ otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. Ha mụta ya, ọ ga-enyere ha aka ịna-amụ ihe nke ọma, ha ga-enwekwa ike ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl nke ọma.
• Oge Ọ Na-ewe Mmadụ Ịgacha Ya: Ruo mgbe onye ahụ mụtara otú e si agụ na otú e si ede.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche.
• Olee Ndị Nwere Ike Ịga Ya?: Ndị nkwusa na ndị na-abụghị ndị nkwusa.
• Otú E Si Edenye Aha: Ndị okenye ọgbakọ na-ahazi klas a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede ma ha chọpụta na ọ dị mkpa ka e nwee ya. Ọ bụ hanwa na-agwakwa onye ọ bụla na-amaghị otú e si agụ na otú e si ede ka o soro na-aga ya.
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
• Ihe Mere E Ji Wepụta Ya: Ọ bụ iji nyere ndị nkwusa aka ka ha bụrụ aka ochie n’ikwusa ozi ọma na ịkụzi Baịbụl.
• Oge A Na-agụru Ya: A naghị agụcha ya agụcha.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche.
• Ònye Nwere Ike Idenye Aha Ya?: Onye nkwusa ọ bụla. Ndị na-abịachi ọmụmụ ihe anya, ndị kwetara ihe Baịbụl na-akụzi, na ndị na-agba mbọ ibi ndụ otú Chineke kwuru nwekwara ike idenye aha ha.
• Otú E Si Edenye Aha: Gakwuru onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma gwa ya ka o denye aha gị.
Klas A Na-akụzi Asụsụ Ala Ọzọ
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ọ bụ ka a kụziere ndị nkwusa otú ha ga-esi jiri asụsụ mba ọzọ na-ezi ozi ọma.
• Oge Ọ Na-ewe Mmadụ Ịgacha Ya: Ọ na-ewe ọnwa anọ ma ọ bụ ọnwa ise. A na-enwekarị ya n’ụtụtụ Satọdee, a na-anọrukwa otu awa ma ọ bụ awa abụọ n’ụbọchị ahụ.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla dị ndị na-abịa ya nso.
• Olee Ndị Nwere Ike Ịga Ya?: Ọ bụ ndị nkwusa na-eme nke ọma n’ọgbakọ, ndị chọkwara iji asụsụ ndị mba ọzọ ekwusa ozi ọma.
• Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-eme ndokwa maka ya ma ha chọpụta na ọ dị mkpa ka e nwee ya.
Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze
• Ihe Mere E Ji Na-eme Ya: Ọ bụ ka e nwee ike wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma rụgharịa ndị nke merela ochie. Ihe a abụghị ụlọ akwụkwọ, ma, a na-akụziri ụmụnna ndị na-arụ ọrụ a aka ọrụ dị iche iche ndị ga-eme ka ha nye aka n’ọrụ a na-arụ.
• Mgbe A Na-akụziru Ya: Ọ dị nwanna a na-akụziri ihe ahụ n’aka.
• Ebe A Na-anọ Akụzi Ya: Ọ bụ ebe ọ bụla Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze nọ ọrụ. E nwekwara ike ịgwa ụfọdụ ndị so na-arụ ọrụ a ka ha gaa nye aka n’obodo ọzọ ebe ụmụnna anyị nwere ọdachi.
• Olee Ndị Na-eso Ha?: Ọ bụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị merela baptizim, ndị ndị okenye ọgbakọ ha kwadoro ka ha soro ha na-arụ ọrụ. Ọ bụghị iwu na ha ga-enwe aka ọrụ.
• Otú Mmadụ Ga-esi Eso Ha: Ndị okenye ọgbakọ ga-enye onye chọrọ iso na-arụ ọrụ a fọm bụ́ Application for Kingdom Hall Construction Volunteer Program (ya bụ, A-25) ka o dejupụta.
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ọ bụ iji kụziere ndị ọsụ ụzọ otú ha ga-esi “jezuo ozi” ha.—2 Tim. 4:5.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe izu abụọ.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a na-anọ enwe ya. Ma, ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ndị ga-abịa ya nso.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ ndị sụrụla ụzọ oge niile ruo otu afọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ.
• Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụ onye nlekọta sekit na-ekpebi ndị ọsụ ụzọ ruru eru ga-aga ya, ọ bụkwa ya na-agwa ha mgbe ha ga-aga ya.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Bịara Betel Ọhụrụ
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ọ bụ iji nyere ndị ọhụrụ bịara Betel aka ka ha nwee ike ime nke ọma n’ọrụ ha na-arụ na Betel.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe ọnwa anọ. Kwa izu, a na-eji otu awa akụziri ndị na-aga ya ihe.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ na Betel.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ ndị so n’ezinụlọ Betel. Ndị ọzọ na-agakwa ya bụ ndị nọrurula otu afọ ma ọ bụ karịa na Betel, ọ bụrụgodị na ha bịara inyetụ aka nwa oge.
• Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-edenye aha ndị ezinụlọ Betel ruru eru ịga ya.
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha n’ọgbakọ. (Ọrụ 20:28) A na-enwe ya site n’oge ruo n’oge, ọ bụkwa Òtù Na-achị Isi na-ekpebi mgbe a ga-enwe ya.
• Oge Ọ Na-ewe: Na nso nso a, nke ndị okenye na-ewe otu ụbọchị na ọkara, nke ndị ohu na-eje ozi na-ewe otu ụbọchị.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ dị ndị ga-aga ya nso.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Naanị ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-aga ya.
• Otú Mmadụ Si Ama na Ya Ga-aga: Ọ bụ onye nlekọta sekit na-agwa ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru mgbe ha ga-aga ya na ebe ha ga-aga ya.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Okenye Ọgbakọa
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị okenye otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha nke ọma n’ọgbakọ.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe ụbọchị ise.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya. Ma, ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ dị ndị ga-aga ya nso.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ naanị ndị okenye.
• Otú E Si Agwa Ndị Ga-aga Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị okenye ruru eru mgbe ha ga-aga ya na ebe ha ga-aga ya.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị na Nwunye Hab
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti otú ha ga-esi na-eleta ọgbakọ nke ọma ma “na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.”—1 Tim. 5:17; 1 Pita 5:2, 3.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe ọnwa abụọ.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ya.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ naanị ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti.
• Otú E Si Agwa Ndị Ga-aga Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti ruru eru na ndị nwunye ha mgbe ha ga-aga ya na ebe ha ga-aga ya.
Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyịc
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwaanyị otú ha ga-esi na-arụsi ọrụ ọgbakọ ike, ya na otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma. Ha gụchaa, a na-eziga ọtụtụ n’ime ha ebe e nwere mkpa ná mba ha. A na-ezigakwa ụfọdụ n’ime ha ná mba ọzọ ma ọ bụrụ na ha agwa alaka ụlọ ọrụ na ha nwere mmasị ịga.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe ọnwa abụọ.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya. Ma, ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’Ụlọ Mgbakọ, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ ụmụnna nwoke ndị na-alụbeghị nwaanyị, ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na iri isii na abụọ. Ha ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị nwekwara mmasị ijere ụmụnna ha na nzukọ Jehova ozi n’ebe ọ bụla e zigara ha. (Mak 10:29, 30) Ha ga-abụrịrị okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi jerela ozi ruo afọ abụọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ.
• Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụrụ na a na-enwe ụlọ akwụkwọ a ná mba unu, ndị nwere mmasị ịga ya na-aga nnọkọ a na-enwe ná mgbakọ sekit maka ndị chọrọ ịga ya. Ná nnọkọ ahụ, a na-agwa ha ihe ndị ọzọ ha kwesịrị ịma.
Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunyed
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya enye ndị lụrụ di na nwunye ọzụzụ pụrụ iche, ka Jehova na nzukọ ya nwee ike iji ha rụọ ọrụ nke ọma. Ha gụchaa, a na-eziga ọtụtụ n’ime ha ebe e nwere mkpa ná mba ha. A na-ezigakwa ụfọdụ n’ime ha ná mba ọzọ ma ọ bụrụ na ha agwa alaka ụlọ ọrụ na ha nwere mmasị ịga.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe ọnwa abụọ.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, Amerịka, ka a nọ nwee klas ndị nke e nwerela. Ka oge na-aga, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ọ bụla ga-ekpebi ebe a ga-anọ enwe nke mba ndị ọ na-elekọta. Ma, e kwesịrị ịnọ n’Ụlọ Mgbakọ ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nwee ya.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ ndị di na nwunye, ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na ise na iri ise na-aga ya. Ha ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị nwekwara mmasị ije ozi n’ebe ọ bụla e nwere mkpa. Ha kwesịrị inwe mmụọ ahụ Aịzaya nwere, bụ́ onye sịrị: “Lee m! Ziga m.” (Aịza. 6:8) Ihe ọzọ bụ na ha ga-abụrịrị ndị di na nwunye lụrụla ruo afọ abụọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ha ga-abụkwa ndị nọrurula afọ abụọ n’ozi oge niile.
• Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụrụ na a na-enwe ụlọ akwụkwọ a ná mba unu, ndị nwere mmasị ịga ya na-aga nnọkọ a na-enwe n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche maka ndị chọrọ ịga ya. Ná nnọkọ ahụ, a na-agwa ha ihe ndị ọzọ ha kwesịrị ịma.
Ụlọ Akwụkwọ Gilied
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị ọsụ ụzọ na ndị ọzọ nọ ozi oge niile ihe ga-enyere ha aka ije ozi ala ọzọ.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe ọnwa ise.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, Amerịka, ka a na-anọ enwe ya.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ ndị di na nwunye, ndị rurula afọ atọ e mere ha baptizim. Ha ga-abụ ndị nọ n’agbata iri afọ abụọ na otu na iri atọ na asatọ mgbe ha dejupụtara akwụkwọ nke mbụ ya. Ha ga-abụkwa ndị di na nwunye lụrụla ruo afọ abụọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ma bụrụ ndị nọrurula afọ abụọ n’ozi oge niile. Ndị nwere mmasị ịga ya ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike. Ndị ọzọ nwere ike itinye akwụkwọ ịga bụ: Ndị ọsụ ụzọ oge niile na-eje ozi ná mba ọzọ (ma ndị nke na-eje ozi ka ndị nọ ozi ala ọzọ); ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị; ndị na-eje ozi na Betel; ndị garala Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị, na Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye.
• Otú E Si Edenye Aha: Ná mba ụfọdụ, a na-agwa ndị nwere mmasị ịga ya ka ha gaa nnọkọ a na-enwe ná mgbakọ distrikti. Ná nnọkọ ahụ, a na-agwa ha ihe ndị ọzọ ha kwesịrị ịma. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ a ma ya abụrụ na a naghị enwe nnọkọ a ná mba unu, i nwere ike degara alaka ụlọ ọrụ unu akwụkwọ ozi ka ha gwa gị ihe ndị i kwesịrị ịma.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha
• Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị so na Kọmitii Alaka otú ha ga-esi na-elekọta ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ebe ha na-eje ozi. A na-akụzikwara ha otú ha ga-esi na-elebara mkpa ọgbakọ, mkpa sekit, na mkpa distrikti anya nakwa otú ha ga-esi na-elebara ọrụ nsụgharị, ọrụ ibi akwụkwọ na ọrụ ikesa akwụkwọ anya. Ha na-amụtakwa otú ha ga-esi hụ na ihe na-aga siriri werere ná ngalaba niile dị n’alaka ha.—Luk 12:48b.
• Oge Ọ Na-ewe: Ọ na-ewe ọnwa abụọ.
• Ebe A Na-anọ Enwe Ya: A na-enwe ya n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, Amerịka.
• Olee Ndị Na-aga Ya?: Ọ bụ ndị so na Kọmitii Alaka na ndị so na Kọmitii Na-elekọta Mba na-aga ya. Ọ bụrụkwa na onye ahụ enweghị kọmitii nke o so, e nwere ike ịgwa ya ka o soro otu n’ime ha ma o si ụlọ akwụkwọ a lọta.
• Otú Mmadụ Si Ama na Ya Ga-aga: Ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-agwa ụmụnna nwoke ruru eru ka ha na nwunye ha gaa ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ka ọ dị ugbu a, ọ bụghị ná mba niile ka e nwere ụlọ akwụkwọ a.
b Ka ọ dị ugbu a, ọ bụghị ná mba niile ka e nwere ụlọ akwụkwọ a.
c Ka ọ dị ugbu a, ọ bụghị ná mba niile ka e nwere ụlọ akwụkwọ a.
d Ka ọ dị ugbu a, ọ bụghị ná mba niile ka e nwere ụlọ akwụkwọ a.