Anyị Kwesịrị Ịna-ekwusa Ozi Ọma Mgbe Niile
1. Olee otú anyị si mara na Ndị Kraịst oge ochie na-ezi ozi ọma mgbe niile?
1 Ndị Kraịst oge ochie ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma “n’akwụsịghị akwụsị.” Ha ziri ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ha hụrụ ha. (Ọrụ 5:42) Nke a pụtara na ha gawa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha anaghị agafe ndị ha hụrụ n’ụzọ n’ezighị ha ozi ọma. Ha mechiekwa, gaa ahịa ịzụrụ ihe, ha anaghị agbachi nkịtị ma o nwee ihe mere ha ga-eji zie mmadụ ozi ọma. Ya bụ, ha na-ekwusa ozi ọma mgbe niile otú ahụ Jizọs mere.—Mak 6:31-34.
2. Olee ihe ọ ga-abụ anyị na-eme, anyị amara na anyị na-eme ihe anyị na-aza n’aha?
2 Jikere Ejikere Mgbe Niile: Baịbụl kpọrọ anyị Ndịàmà Jehova. Aha ahụ gosiri ọrụ anyị na-arụ na ndị anyị bụ. (Aịza. 43:10-12) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe niile izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, a sịgodị na anyị anọghị ozi ụlọ n’ụlọ. (1 Pita 3:15) Chee echiche ihe ọ ga-abụ ya mee, gị ejiri ohere ahụ zie ozi ọma, cheekwa echiche otú ị ga-esi ezi ya. Gbaa mbọ jiri akwụkwọ anyị na-aga ebe ọ bụla ị na-aga, ka i nwee ike inye ya onye ọ bụla nwere mmasị ịgụ ya. (Ilu 21:5) Gbalịa na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ị hụrụ ha, ọ bụghị naanị mgbe ị nọ ozi ụlọ n’ụlọ.
3. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịsị na àmà anyị gbaara mmadụ n’oge anyị na-anọghị ozi ụlọ n’ụlọ bụ àmà mberede?
3 Ọ Bụghị Àmà Mberede: N’oge gara aga, ọ na-abụ anyị zie mmadụ ozi ọma mgbe anyị na-anọghị ozi ụlọ n’ụlọ, anyị asị na anyị gbara àmà mberede. Ma, isi otú ahụ akọwa ụdị ozi ọma ahụ anyị ziri ga-eme ka o yie ka anyị adịghị njikere ikwusa ya ma ọ bụkwanụ na anyị ebughị ya n’obi, ka à ga-asị na ọ dịchaghị mkpa. Anyị ekwesịghị ịsị na àmà anyị gbara n’oge anyị na-anọghị n’ozi bụ àmà mberede. Nke bụ́ eziokwu bụ na ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ka bụ ụzọ kacha mma anyị si enweta ndị mmadụ zie ha ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, mkpa Ndị Kraịst oge ochie abụghị ịga n’ụlọ ndị mmadụ, kama ọ bụ izi ndị mmadụ n’onwe ha ozi ọma. Ha ziri ndị mmadụ ozi ọma n’oge ọ bụla nakwa n’ebe ọ bụla, ma n’ebe ọhaneze na-anọkarị, ma n’oge ha na-anọghị n’ozi, ma mgbe ha gara n’ụlọ n’ụlọ. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ ha mere, anyị ga-ejezu ozi anyị.—2 Tim. 4:5.