Ihe Atọ Ga-enyere Gị Aka Ịna-akụzikwu Ihe nke Ọma
1. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị gbalịa na-akụzikwu ihe nke ọma?
1 Ndị nkwusa niile bụ ndị nkụzi. Ọ bụ ịkụziri ndị mmadụ ihe ka anyị kwo ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ bụkwa ya mere anyị ji aga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị ma ọ bụkwanụ na-amụrụ ha Baịbụl. Ihe anyị na-akụziri ha dịkwa ezigbo mkpa. Anyị na-akụziri ha ‘ihe odide ndị dị nsọ,’ bụ́ ndị ga-enyere ha aka ‘inweta nzọpụta.’ (2 Tim. 3:15) Ihe ùgwù a Chineke nyere anyị enweghị atụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ ọ ga-abụ anyị na-eme, otú anyị si ezi ihe adịkwuo mma.
2. Olee otú anyị ga-esi kụziere ndị mmadụ ihe ka ọ dịrị ha mfe nghọta?
2 Kwuo Ya Otú Ọ Ga-adị Mfe Nghọta: Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ichefu na ihe anyị ma nke ọma nwere ike ịra onye na-amaghị ya ahụ́ nghọta. N’ihi ya, mgbe ị na-amụrụ mmadụ ihe, gbalịa ka ị ghara iwebata ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Kama, kwuo naanị ihe ga-enyere onye ahụ aka ịghọta ihe unu na-amụ. E jighị oké okwu ama onye ma akụzi ihe. (Ilu 10:19) Ọ na-aka mma ịgụ naanị amaokwu Baịbụl ndị dị ezigbo mkpa. A gụchaa ha, e lekwasị anya n’ebe kọwara isi ihe a na-amụ. Jizọs kụziri ọtụtụ ihe gbara ọkpụrụkpụ mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu ahụ e dere na Matiu isi 5 ruo 7. Ma, o kwuru ya otú ọ ga-adị mfe nghọta, o kwughịkwa oké okwu.
3. Olee uru ihe atụ bara? Oleekwa ụdị nke na-aka mma iji akụzi ihe?
3 Jiri Ihe Atụ: Ihe atụ na-enyere onye a na-agwa okwu aka ichebara ihe a na-agwa ya echiche. Ọ na-eme ka ihe a gwara ya ruo ya n’obi ma nyere ya aka icheta ya. Echekwala na onye chọrọ ime ihe atụ ga-akọrịrị akụkọ. I nwere ike jiri ihe atụ ndị dị mfe nghọta kụzie ihe nke ọma n’akọwaghị ogologo akụkọ. Ọ bụ ụdị ihe atụ ndị ahụ ka Jizọs na-ejikarị akụziri ndị mmadụ ihe. (Mat. 7:3-5; 18:2-4) Mmadụ nwedịrị ike see obere ihe n’akwụkwọ, jiri ya kụzie ihe. Ọ bụrụ na i buru ụzọ chee echiche nke ọma, ị ga-echepụta ihe atụ ị ga-eji mee ka ihe ị na-akụziri mmadụ doo ya anya.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị jụọ onye anyị na-amụrụ ihe ajụjụ?
4 Na-ajụ Ajụjụ: Ajụjụ na-enyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka iche echiche. N’ihi ya, ị jụọ onye ị na-amụrụ ihe ajụjụ, nwee ndidi ka ọ zaa ya. Ọ bụrụ na ị zaa ajụjụ ahụ, ị gaghị ama ma ọ̀ na-aghọta ihe ị na-akụziri ya. Ọ bụrụ na ọ zataghị ihe ị jụrụ ya, jiri otú ọzọ jụọ ya ajụjụ ahụ. Ọ ka mma ime otú ahụ kama ịgwa ya azịza ya. (Mat. 17:24-27) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye n’ime anyị bụ́ a gachaa ọ gwụ ma a bịa n’ịkụziri ndị ọzọ ihe. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị lezie anya n’otú anyị si akụzi ihe. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na ndị na-ege anyị ntị ga-enweta ndụ ebighị ebi.—1 Tim. 4:16.