Ndị Mmadụ Na-abịa ma Anyị Kpọọ Ha
N’afọ a, anyị ga-akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa mgbakọ distrikti. Ọgbakọ ọ bụla ga-amalite ya ma ọ fọdụ izu atọ tupu ha agaa mgbakọ ha. E nwere ezigbo ihe mere anyị ji akpọ ndị mmadụ ka ha bịa mgbakọ anyị kwa afọ. Ihe ndị a na-eme ná mgbakọ anyị na-amasị ndị na-abịa ya. Ha na-enwe obi ụtọ n’okwu ndị sitere na Baịbụl a na-ekwu, otú ndị wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ si ahụ na ihe na-aga nke ọma nakwa àgwà ọma anyị na-akpa. Otú anyị si dịrị n’otu na-amasịkwa ha. (Ọma 110:3; 133:1; Aịza. 65:13, 14) Ndị anyị kpọrọ òkù hà na-abịa mgbakọ anyị a sịgodị na ebe ha ga-esi abịa ya dị anya?
Mgbe e mechara mgbakọ distrikti n’afọ 2011, otu alaka ụlọ ọrụ anyị nwetara akwụkwọ ozi otu nwaanyị detaara ha. Nwaanyị ahụ kwuru na ya hụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù n’ọnụ ụzọ ụlọ ya. O kwukwara na ya na-ezo mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova bịara na nke ya. Ihe ọzọ o dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Ụlọ anyị mara mma. Di m hụkwara m n’anya. M chere na m ga na-enwe obi ụtọ mgbe niile. Ma, anaghị m enwe obi ụtọ, ndụ m enweghịkwa isi. M kpebiri ịga mgbakọ n’ụbọchị Satọdee. M nyaara ụgbọala gawa ebe ahụ n’ihi na m chọrọ ihe ga-eme m obi ụtọ. Isi n’ụlọ anyị gawa ebe ahụ dị narị kilomita atọ na iri abụọ.” Ihe ọ hụrụ ná mgbakọ ahụ mere ya obi ụtọ nke na ọ kpọrọ di ya, gwa ya na ya agaghị alọta n’ụbọchị ahụ ka ya nwee ike ịga nke Sọnde. O kwukwara sị, “Egere m okwu niile, matakwa ọtụtụ Ndịàmà Jehova. M kpebiziri na mụ na ha ga na-akpazi.” Mgbe ọ lara n’ụlọ ya, a malitere ịmụrụ ya Baịbụl. Ka ọnwa anọ gachara, ọ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ihe ọzọ o kwuru bụ na obi dị ya ezigbo ụtọ na ndụ ya enweela isi ugbu a n’ihi akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ e dewere n’ọnụ ụzọ ya.
Ụfọdụ ndị anyị kpọrọ ga-abịa mgbakọ anyị. N’ihi ya, soro kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù nke mgbakọ distrikti afọ a. Ọ bụrụ na i kechaghị ndị nke e nyere gị, chịrị ha gaa mgbakọ ka i nwee ike inye ha ndị ọ bụla ị hụrụ n’ụzọ mgbe ị na-aga ya.
[Igbe dị na peeji nke 3]
Ihe Anyị Ga-ekwu ma Anyị Chọọ Inye Mmadụ Akwụkwọ Ịkpọ Òkù
Iji hụ na anyị kesara akwụkwọ ịkpọ òkù n’ókèala anyị niile, anyị ekwesịghị ikwuwe oké okwu. I kelechaa onye ị gara na nke ya, i nwere ike ikwu, sị: “Anyị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ a iji kpọọ ha ka ha soro anyị gaa mgbakọ anyị ga-enwe n’afọ a. Were nke gị. Ị gụọ ya, ị ga-ama ihe ndị ọzọ e kwuru gbasara ya.” Jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu. I nyewe mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ná ngwụcha izu, i nwere ike inyekwu ya magazin anyị.