Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Ka Ha Bịa Mgbakọ Ukwu
1. Olee mgbe anyị ga-ebido ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa mgbakọ ukwu anyị?
1 Ọ bụrụ na ị chọrọ imere ikwu na ibe gị ma ọ bụ ndị enyi gị oriri nke ga-ewe gị ma oge ma ego, o doro anya na ị ga-eji obi ụtọ na-agwa ha ka ha bịa. A haziela ọtụtụ ihe ka anyị nwee ike ịmụta ihe ná mgbakọ ukwu a ga-enwe n’afọ a. Jehova enyela anyị ọrụ ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa mgbakọ a. Anyị ga-ebido ịkpọ ha mgbe ọ fọrọ izu atọ ka anyị gaa nke e kenyere ọgbakọ anyị. Gịnị ga-enyere anyị aka iji obi ụtọ na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa mgbakọ ukwu ahụ?
2. Gịnị ga-enyere anyị aka iji obi anyị niile kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa mgbakọ ukwu anyị?
2 Ọ bụrụ na anyị eburu n’obi na e nwere ọtụtụ ihe Jehova na-akụziri anyị ma anyị gaa mgbakọ ukwu, ọ ga-eme ka anyị jiri obi anyị niile kpọọ ọtụtụ ndị ka ha bịa mgbakọ a. (Aịza. 65:13, 14) Anyị kwesịkwara icheta na òkù anyị na-akpọ ndị mmadụ kwa afọ bara uru. (Gụọ ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ọ Bara Uru.”) Ụfọdụ ndị anyị kpọrọ òkù ga-abịa. N’agbanyeghị mmadụ ole zara òkù ahụ, ihe anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile bụ na otú anyị si jiri obi anyị niile kpọọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa mgbakọ a na-enye Jehova otuto, na-egosikwa na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya.—Ọma 145:3, 7; Mkpu. 22:17.
3. Olee otú a ga-esi kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù maka mgbakọ ukwu?
3 Ndị okenye ọgbakọ ọ bụla ga-eji aka ha hazie otú a ga-esi kpọọ mmadụ niile nọ n’ókèala ha òkù. Ha ga-ekpebi ma à ga na-afanye akwụkwọ ịkpọ òkù n’ụzọ ndị na-anọghị n’ụlọ ma ọ bụkwanụ ma à ga na-enye ya ndị mmadụ n’okporo ámá. E nwere ike inyekọta ndị mmadụ magazin na akwụkwọ ịkpọ òkù n’ụbọchị Satọdee na Sọnde. Izu atọ ahụ gachaa, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi kpọọ ndị mmadụ òkù ka ha soro anyị gaa oriri Jehova kpọrọ anyị.