Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/13 p. 1
  • Okwu Chineke Bara Uru Iji Zie Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwu Chineke Bara Uru Iji Zie Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Nweta Abamuru nke Izi Ihe Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Chebe Uche Gị
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • ‘Ka Uche Chineke Mee’
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 10/13 p. 1

Okwu Chineke Bara Uru Iji Zie Ihe

1. Gịnị bụ isiokwu mgbakọ sekit anyị ga-aga n’afọ 2014? Olee ajụjụ a ga-aza ná mgbakọ ahụ?

1 Jehova bụ “Onye Ozizi Ukwu” anyị. O nweghị onye nkụzi dị ka ya, ma n’eluigwe ma n’ụwa. (Aịza. 30:20, 21) Ma, olee otú Jehova si ezi anyị ihe? O nyere anyị akwụkwọ kacha akwụkwọ niile. Akwụkwọ ahụ bụ Baịbụl. O nyekwara ndị dere ya mmụọ nsọ ya. Olee otú ihe Jehova na-akụziri anyị ga-esi mee ka anyị na-enwe ezigbo ahụ́ ike, na-eche ihe dị mma, na-eme ka ahụ́ ruo anyị ala, na-emekwa ka anyị na ya dịrị ná mma? A ga-aza ajụjụ a ná mgbakọ sekit anyị ga-aga n’afọ 2014. Isiokwu mgbakọ ahụ ga-abụ “Okwu Chineke Bara Uru Iji Zie Ihe.” O si na 2 Timoti 3:16.

2. Olee ajụjụ ndị a ga-aza ná mgbakọ sekit afọ ọzọ bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịghọta isi ihe ndị a ga-ekwu?

2 Isi Ihe Ndị A Ga-atụle: O nwere ajụjụ itoolu e dere n’okpuru ebe a. A ga-aza ha ná mgbakọ ahụ. Ha ga-enyere anyị aka ịghọta isi ihe ndị a ga-ekwu. Ajụjụ ndị ahụ bụ:

• Olee uru ihe Chineke na-ezi anyị na-abara anyị? (Aịza. 48:17, 18)

• Ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ ịhazi oge anyị ka anyị nwee ike ijere Jehova ozi oge niile, gịnị ka Jehova ga-emere anyị? (Mal. 3:10)

• Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma a chọọ izi anyị “ozizi ọhụrụ” ọ bụla? (Hib. 13:9)

• Olee otú anyị ga-esi ṅomie ‘otú Jizọs si zie ihe’? (Mat. 7:28, 29)

• Gịnị mere ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ ga-eji na-akụziri onwe ha ihe? (Rom 2:21)

• Olee uru Okwu Chineke bara? (2 Tim. 3:16)

• Gịnị ka ndị mmadụ na-eme n’ihi otú Jehova si eme ka mba niile “maa jijiji”? (Hag. 2:6, 7)

• Gịnị ka obi siri Jehova ike na anyị ga-emeli? (Efe. 5:1)

• Olee ihe mere anyị ga-eji gbalịsie ike ka anyị nọgide n’ozizi Jehova? (Luk 13:24)

3. Gịnị mere anyị ji kwesị ịga mgbakọ sekit nke afọ 2014 ma gee ntị nke ọma?

3 Tupu Pọl edee ihe dị na 2 Timoti 3:16, o kwuru ihe ndị ga na-eme n’ụwa n’oge ikpeazụ a. O dere, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ, na-eduhie ndị mmadụ ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Tim. 3:13) Ọ bụrụ na anyị achọghị ka e duhie anyị, anyị kwesịrị ịna-ege ntị n’ihe Jehova na-akụziri anyị, na-emekwa ya. N’ihi ya, ka anyị kpebie na anyị ga-ege ntị ma anyị gaa mgbakọ sekit n’afọ ọzọ, bụ́ nke a haziri ka ọ baara anyị uru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya