‘Ka Uche Chineke Mee’
1. Gịnị bụ isiokwu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2012, oleekwa ihe mere anyị ga-eji gaa mgbakọ ahụ?
1 Jehova kere anyị n’ihi na ọ bụ uche ya ka anyị dịrị. (Mkpu. 4:11) N’ihi ya, anyị agaghị ejili ndụ anyị mee ihe Chineke chọrọ ka anyị jiri ya mee ma ọ bụrụ na anyị amaghị uche ya ma ọ bụkwanụ na-eme ya. Ime uche Chineke adịghị mfe n’ihi na anyị na-agba mgba ka anyị ghara ime “ihe anụ ahụ́ anyị na echiche anyị chọrọ” ma ọ bụkwanụ mee “ihe ndị mba ọzọ na-achọ.” (Efe. 2:3; 1 Pita 4:3; 2 Pita 2:10) Ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị anyị, ‘Ekwensu ga-ejide anyị ná ndụ, mee ka anyị mewe uche ya.’ (2 Tim. 2:26) Ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2012 ga-enyere anyị aka ime uche Chineke n’ihi na ọ bụ ihe nke atọ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe n’ekpere. (Mat. 6:9, 10) Isiokwu ya bụ: “Ka Uche Chineke Mee.”
2. Ka ụmụnna na-arịgote na-ekwu okwu, olee ajụjụ ndị a ga-aza?
2 Ajụjụ Ndị A Ga-aza: Ka ụmụnna na-arịgote na-ekwu okwu, na-ege ntị ka ị nụ mgbe a ga-aza ajụjụ ndị a na-esonụ: Olee ihe dị mkpa otú ịnụ Okwu Chineke dị? Olee otú anyị nwere ike isi nọgide na-aghọta ihe bụ́ uche Chineke maka anyị? Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị nwee mmasị inyere ụdị mmadụ niile aka? Olee otú i nwere ike isi bie ndụ dị mma, nke na-enye obi ụtọ? Ndị na-eto eto, olee ihe ọ dị mkpa ka unu gosi Jehova? Olee uru ndị a na-erite n’ime uche Chineke? Gịnị mere o ji dị oké mkpa ugbu a ka anyị wusie ndị ọzọ ike ma gbaa ha ume?
3. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike irite ezigbo uru ná mgbakọ a na-abịanụ?
3 Gbalịa bịa mgbakọ a, geekwa ntị nke ọma mgbe ọkà okwu nke ọ bụla na-ekwu okwu. E nwere ike inwe ọkà okwu ga-esi Betel bịa ma ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke ga-esi esi bịa kwuo okwu ná mgbakọ unu. I nwere ike ịgakwuru ya na nwunye ya, ma ọ bụrụ na ọ lụrụ nwaanyị, ka unu kparịta ụka tupu ihe omume amalite ma ọ bụkwanụ mgbe a gbasara. Ị laruo, ‘echefukwala ihe ndị ị nụrụ,’ kama, gị na ndị ezinụlọ unu tụlee ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ, kwurịtakwanụ ihe unu nwere ike ime iji na-emekwu uche Chineke.—Jems 1:25.
4. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-eme uche Chineke mgbe niile?
4 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị na-eme ihe masịrị ha, bụ́ ndị jụkwara ime uche ya. (1 Jọn 2:17) N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ na Jehova kwadebeere anyị mgbakọ a n’oge kwesịrị ekwesị iji nyere anyị aka ịna-eme uche ya mgbe niile.