Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe n’Ịntanet Na-akụziri Ụmụ Gị Ihe
1. Olee uru ebe ahụ e dere “Ụmụaka” n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ga-abara ezinụlọ ọ bụla?
1 Anyị na-etinye ihe ga-abara ma ụmụaka ma ndị okenye uru n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. I mepee ya, ị ga-ahụ ebe e dere “Ihe Ndị Baịbụl Na-akụzi.” Ị pịa ya, ị hụ ebe e dere “Ụmụaka.” Ihe a na-etinye ebe ahụ na-enyere ndị nne na nna aka ịbịaru ụmụ ha nso. Ọ na-enyekwara ma nne ma nna ma ụmụaka aka ịbịarukwu Jehova nso. (Diut. 6:6, 7) Olee otú ị ga-esi jiri ebe ahụ na-akụziri ụmụ gị ihe?
2. Olee ihe ndị ị ga-echebara echiche tupu gị ahọrọ ihe gị na nwa gị ga-amụ?
2 Na-akụziri Ụmụ Gị Ihe Ga-akacha Abara Ha Uru: Nwatakịrị nke ọ bụla nwere ihe a ga-akụziri ya ya abaara ya ezigbo uru. (1 Kọr. 13:11) Olee otú ị ga-esi họrọ ihe ị ga-akụziri nwa gị nke ga-akacha abara ya uru? Tupu ị họrọ ihe ọ bụla, buru ụzọ jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe nwa m ga-enwe mmasị ịmụ? Mụ na ya mụwa ihe ahụ ọ̀ ga-aghọtali ya? Olee mgbe ike nwere ike ịgwụ ya ma anyị na-amụ ihe?’ I nwere ike iji ihe dị n’ebe e dere “Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl” na-amụrụ nwa dị afọ atọ ma ọ bụ nke na-erubeghị afọ atọ ihe. E nwere nne na nna ndị ọ na-amasị ịkọrọ ụmụ ha akụkọ dị iche iche a kọrọ na Baịbụl. I mepee ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ị ga-ahụ akụkọ ndị si na Baịbụl n’ebe e dere “Kụziere Ụmụ Gị Ihe.” E nwekwara ihe ndị ọzọ i nwere ike ịhọrọ ka i jiri ha na-akụziri ụmụ gị ihe.
3. Olee otú ndị nne na nna ga-esi jiri akụkọ na ihe ndị ọzọ dị n’ebe e dere “Ihe E Ji Enwe Ofufe Ezinụlọ” na-akụziri ụmụ ha ihe?
3 Ihe E Ji Enwe Ofufe Ezinụlọ: Ị pịa ebe e dere “Ụmụaka,” ị ga-ahụ “Ihe E Ji Enwe Ofufe Ezinụlọ.” Ebe a na-enyere ndị nna aka ịkụziri ụmụ ha ihe. Ị pịa “Ihe E Ji Enwe Ofufe Ezinụlọ,” ị ga-ahụ ebe e dere “Danlodu.” Ọ bụrụ na ị pịa “Danlodu,” ị ga-ahụ ebe e dere “Ihe Nne na Nna Ga-eme.” Gụọ ya ka ị mara otú ị ga-esi jiri ya kụziere ụmụ gị ihe. I nwekwara ike ibipụtara ụmụ gị ndị obere “Foto E Ji Akụzi Ihe.” Ha nwere ike ịna-ete foto ndị ahụ kreyọn. Nyere ụmụ gị ndị nke na-eto eto aka ka ha dejupụta ihe dị n’ebe e dere “Ihe Ndị Na-eto Eto Ga-eji Na-amụ Baịbụl.” N’ebe niile anyị kpọrọ aha, ị ga-ahụ akụkọ ya na ibe ya yiri. Dị ka ihe atụ, ị gaa na ha, ị ga-ahụ akụkọ Josef. N’ihi ya, nwa gị nke ọ bụla ga-enwe ike ime ihe omume nke ya ma unu na-enwe ofufe ezinụlọ.
4. Olee ihe ndị dị n’ebe e dere “Bụrụ Enyi Jehova”?
4 Bụrụ Enyi Jehova: Ị pịa ebe e dere “Bụrụ Enyi Jehova,” ị ga-ahụ vidio, abụ, na ihe ndị ọzọ ndị nne na nna ji akụziri ụmụ ha Okwu Chineke. (Diut. 31:12) Katuun nke ọ bụla dị ebe ahụ nwere ihe dị mkpa ọ na-akụziri ụmụaka. Ebe ndị ahụ a na-asị ụmụaka chọwa ihe ga-enyere ha aka ịghọta ihe dị mkpa a na-akụzi ebe ahụ. Ị manụ na abụ na-atọ ụmụaka ụtọ. Ọ na-enyekwara ha aka icheta ihe ndị a kụziiri ha. N’ihi ya, ị ga-ahụ abụ anyị ndị ụmụaka bụrụ na abụ ndị ọzọ e dere maka ụmụaka n’ebe ahụ.
5. Gịnị mere ndị nne na nna ga-eji rịọ Jehova ka o nyere ha aka ịkụziri ụmụ ha eziokwu dị na Baịbụl?
5 Ndị nne na nna, Jehova chọrọ ka unu zụọ ụmụ unu nke ọma. Rịọnụ ya ka o nyere unu aka ka unu kụziere ụmụ unu eziokwu dị na Baịbụl. (Ikpe 13:8) Ọ ga-enyere unu aka ka unu zụọ ụmụ unu ka ha ‘mara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe ha nwere n’ime Kraịst Jizọs.’—2 Tim. 3:15; Ilu 4:1-4.