Olee Ihe Ị Ga-eme n’Oge Ndị Mmadụ Na-eme Ememme?
Ọtụtụ ndị na-anọkarị n’ụlọ n’oge ha na-eme ememme. Oge a bụkwa oge anyị nwere ike ịgakwuru ha ha ege ntị n’ozi ọma anyị. A na-agbakwa ọgbakọ dị iche iche ume ka ha mee ndokwa otú ha ga-esi gaa ozi ọma mgbe ọ bụla ndị mmadụ na-eme ememme. Ọ bụrụ na ndị bi n’ókèala unu anaghị alakpu ụra n’oge ma ha na-eme ememme, ọ pụtara na ha agaghị na-eteta n’oge. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka a ghara inwe nzukọ ozi ubi mgbe ọgbakọ ji enwe ya ka e wee ghara ịga n’ụlọ ndị mmadụ mgbe ha na-etetabeghị n’ụra. Ọ ga-adịkwa mma ma a maara ọgbakọ ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na e mere ndokwa pụrụ iche ka ọgbakọ gaa ozi ọma n’oge ndị mmadụ na-eme ememme. E kwesịkwara ịgba ndị nkwusa niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụbọchị ndị mmadụ na-eme ememme nwere ike ịbụ ụbọchị anyị ji ezu ike n’ụlọ anyị ma ọ bụkwanụ oge anyị ga-eji eme ihe ndị ọzọ dịịrị anyị. Ma, anyị nwere ike gatụ ozi ọma, anyị lọta anyị emewezie ihe ndị ọzọ. Obi ga-adịkwa anyị ụtọ maka na anyị gara ozi ọma n’ụbọchị ahụ.—Mat. 11:29, 30.