Ịmụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl Otú Ọ Ga-eru Ha n’Obi
1. Gịnị ka ndị nkwusa na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl kwesịrị ịna-eme?
1 E nweghị onye ga-efe Chineke ma ọ bụrụ na Jehova “adọtaghị ya.” (Jọn 6:44) Ma n’agbanyeghị na ọ bụ Jehova na-adọta ndị na-efe ya, ndị nkwusa kwesịrị inyere ndị ha na-amụrụ ihe aka ka ha bịaruo Nna ha nke eluigwe nso. (Jems 4:8) N’ihi ya, ndị nkwusa kwesịrị ịna-akwado nke ọma. Naanị ịgụpụta paragraf na ịjụ onye anyị na-amụrụ ihe ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ agaghị enyere ya aka ịghọta ihe dị na Baịbụl na ime ya eme.
2. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị na-amụrụ mmadụ ruo ya n’obi, gịnị ka anyị ga-enyere ya aka ime?
2 Ọ bụrụ na ndị nkwusa chọrọ ịmụrụ mmadụ ihe ka o ruo ya n’obi, ha kwesịrị inyere ya aka (1) ka ọ ghọta ihe Baịbụl na-akụzi, (2) ka o kweta ihe Baịbụl kwuru, (3) ka ọ na-emekwa ihe Baịbụl na-akụzi. (Jọn 3:16; 17:3; Jems 2:26) O nwere ike iwe anyị ọtụtụ ọnwa tupu anyị enyere mmadụ aka ime ihe ndị a. Ma, mgbe ọ bụla o mere nke ọ bụla n’ime ha, ya na Jehova ga na-adịkwu ná mma, ọ ga-enyekwara ya aka ikpebi ịrara onwe ya nye Jehova.
3. Gịnị mere ndị nkwusa chọrọ ịkụziri mmadụ ihe ka o ruo ya n’obi ji ajụ ajụjụ ga-eme ka onye ahụ kwuo obi ya?
3 Ihe Anyị Na-amụ Ọ̀ Na-eru Ya n’Obi?: Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ma onye ị na-amụrụ ihe ọ̀ na-aghọta ihe ị na-akụziri ya, na-ekwetakwa ha, gbaa ya ume ka ọ na-ekwu ihe dị ya n’obi. Ya abụla naanị gị ga na-ekwu okwu. (Jems 1:19) Ọ̀ ghọtara ihe Baịbụl kwuru banyere isiokwu unu na-atụle? Ọ̀ ga-akọwali ihe ahụ n’agụpụtaghị ya n’akwụkwọ? Olee otú obi dị ya banyere ihe ọ na-amụta? Ò kwetara na ihe Baịbụl na-akụzi kwesịrị ekwesị? (1 Tesa. 2:13) Ọ̀ ghọtara na ihe ọ na-amụta kwesịrị ime ka ọ gbanwee ndụ ya? (Kọl. 3:10) Anyị chọọ ịmata azịza ajụjụ ndị a, anyị kwesịrị ịna-ajụ ya ajụjụ ndị ga-eme ka o kwuo obi ya. Anyị kwesịkwara ịtọ ntị n’ala ma o kwuwe okwu.—Mat. 16:13-16.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e nwere isiokwu siiri onye anyị na-amụrụ ihe ike nghọta ma ọ bụ na e nwere àgwà siiri ya ike ịgbanwe?
4 Ị manụ na ọ na-esiri onye ọ bụla ike ịhapụ àgwà ọ bụla maarala ya ahụ́. (2 Kọr. 10:5) Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ ihe ekwetaghị ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụkwanụ na ọ malitebeghị ime ya? Anyị kwesịrị inwere ya ndidi ka mmụọ Chineke mee ka ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl ruo ya n’obi. (1 Kọr. 3:6, 7; Hib. 4:12) Ọ bụrụ na e nwere isiokwu siiri ya ike nghọta ma ọ bụ na e nwere àgwà siiri ya ike ịgbanwe, kama isi ọnwụ na ọ ga-aghọtarịrị ya ma ọ bụ na ọ ga-agbanwerịrị, ọ ka mma ka anyị mụrụ ihe na-aga. Ka oge na-aga, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ ghọta ihe ahụ ma ọ bụ gbanwee ma ọ bụrụ na anyị enweere ya ndidi, jirikwa ịhụnanya na-akụziri ya ihe.