AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ESTA 6-10
Esta Gbachiteere Jehova na Ndị Na-efe Ya
Esta achọghị naanị ọdịmma ya, kama, o ji obi ike gbachitere Jehova na ndị Juu ibe ya
Ihe dịịrị Esta na Mọdekaị mma. Ma, a ka na-ezigara ndị Juu bi n’ebe niile eze Ahazuirọs na-achị akwụkwọ ozi Heman dere, nke kwuru na a ga-egbu ha niile
Esta gakwara n’ihu eze ọzọ mgbe eze na-akpọghị ya n’agbanyeghị na ọ ma na e nwere ike igbu ya. O bere ákwá, rịọkwa eze ka ọ gbanwee iwu ahụ e tiri ka e gbuo ndị Juu niile
A naghị agbanwe iwu ọ bụla eze bịanyere aka na ya. N’ihi ya, eze nyere Esta na Mọdekaị ikike ka ha tie iwu ọhụrụ
Jehova mere ka ndị ya merie
Egwú dagharịrị, e zizie ndị Juu ozi ka ha jikere ịlụso ndị ọ bụla chọrọ igbu ha ọgụ
Ndị na-agba ịnyịnya gazuru ebe niile eze na-achị zie ndị Juu ozi ahụ, ha jikekwaara agha
Ọtụtụ ndị hụrụ ihe gosiri na Chineke nọnyeere ndị Juu. Ha sonyekwaara ha na-efe Chineke