Esta
8 N’ụbọchị ahụ, Eze Ahazuirọs nyere Esta nwunye ya ihe niile Heman, onye iro ndị Juu,+ nwe.+ Mọdekaị wee bịa ịhụ eze, n’ihi na Esta ekwuola otú ya na ya si bụrụ nwanne.+ 2 Eze wee gbapụta mgbaaka o ji aka ihe akara,+ nke ọ napụtara Heman, nye Mọdekaị. Esta mekwara Mọdekaị onyeisi ụlọ Heman.+
3 Esta gwakwara eze okwu ọzọ. Ọ dara n’ala n’ụkwụ ya bee ákwá, rịọkwa ya ka o mee ka a ghara ime ndị Juu ihe ọjọọ Heman, onye agbụrụ Egag, kpara nkata ime ha.+ 4 Eze wee setịara Esta mkpanaka ọlaedo ya,+ Esta ebilie guzoro n’ihu eze. 5 Esta wee sị: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ọ bụrụkwa na ihe a kwesịrị ekwesị n’anya eze, ọ bụrụkwa na m dị mma n’anya ya, ka e dee ya edee na a kagbuola ihe ahụ e dere n’akwụkwọ, ya bụ, nkata ahụ Heman nwa Hamedeta, onye agbụrụ Egag,+ kpara,+ nke o dere iji bibie ndị Juu bi n’ógbè* niile eze na-achị. 6 Olee otú m ga-esi agbachi nkịtị nọrọ na-ekiri ọdachi ga-adakwasị ndị m? Oleekwa otú m ga-esi agbachi nkịtị nọrọ na-ekiri ka a na-ebibi ndị ikwu m?”
7 Eze Ahazuirọs wee gwa Esta nwunye ya na Mọdekaị onye Juu, sị: “Enyela m Esta ihe niile Heman nwe.+ A kwụwakwala Heman n’osisi,+ n’ihi nkata ọ kpara ibibi* ndị Juu. 8 Unu nweziri ike dee ihe ọ bụla dị unu mma n’aha eze maka ọdịmma ndị Juu. Jirikwanụ mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara, n’ihi na a gaghị agbanweli ihe ọ bụla e dere n’aha eze, nke e jikwa mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa akara.”+
9 N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa nke atọ, ya bụ, n’ọnwa Saịvan,* a kpọkọtara ndị odeakwụkwọ eze n’oge ahụ, ha edee ihe niile Mọdekaị chọrọ ka ndị niile mee, ma ndị Juu ma ndị setrap+ ma ndị gọvanọ ma ndị isi otu narị ógbè*+ na iri abụọ na asaa (127) ndị dị malite n’India ruo Etiopia. Ha dere nke ógbè* ọ bụla otú ndị ebe ahụ si ede ihe, deekwa nke ndị ọ bụla n’asụsụ ha, deekwa nke ndị Juu otú ha si ede ihe nakwa n’asụsụ ha.
10 O dere akwụkwọ ozi ahụ n’aha Eze Ahazuirọs, jirikwa mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara+ wee si n’aka ndị na-eji ịnyịnya eje ozi zipụ ya. Ịnyịnya ha ji gaa bụ ndị e ji ejere eze ozi. Ha na-awụkwa ajọ ọsọ. 11 Ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ na eze enyela ndị Juu bi n’obodo niile ikike izukọ zọọ ndụ ha,* ka ha bibie ndị agha nke ndị ọ bụla ma ọ bụ nke ógbè* ọ bụla chọrọ ịlụso ha agha, ka ha gbuo ha ma laa ha n’iyi, ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị, ka ha kwakọrọkwa ihe ha.+ 12 Ihe a ga-eme n’otu ụbọchị, n’ógbè* niile Eze Ahazuirọs na-achị, n’abalị iri na atọ n’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, n’ọnwa Eda.*+ 13 A ga-eme ka ihe ahụ e dere n’akwụkwọ ahụ bụrụ iwu n’ógbè* niile. A ga-akpọsara ya ndị niile, ka ndị Juu jikere n’ụbọchị ahụ ịlụso ndị iro ha agha.+ 14 Ndị ozi eze, ndị na-agba ịnyịnya e ji ejere eze ozi, gawara ngwa ngwa otú eze kwuru. E tikwara iwu ahụ na Shushan,*+ bụ́ ebe obí eze dị.*
15 Ma Mọdekaị yiiri uwe onye eze si ebe eze nọ pụọ. E ji ákwà na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ọcha kwaa uwe ahụ. O kpu nnukwu okpueze ọlaedo, yirikwa uwe mgbokwasị e ji ákwà mara mma na ogho pọpụl kwaa.+ Ndị bi na Shushan* nọkwa na-aṅụrị ezigbo ọṅụ. 16 A napụtara ndị Juu.* Ha ṅụrịkwara ọṅụ, obi ana-atọ ha ụtọ, ndị mmadụ ana-akwanyekwara ha ùgwù. 17 N’ógbè* niile na n’obodo niile a kpọsara ihe eze kwuru na iwu o tiri, ndị Juu nọ na-aṅụrị ọṅụ, obi ana-atọ ha ụtọ, ha ana-eri, na-aṅụ, na-ekporikwa ndụ. Ọtụtụ ndị obodo dị iche iche na-ekwukwa na ha bụzi ndị Juu,+ n’ihi na ụjọ ndị Juu tụwara ha.