Ebe otu nwanna nwaanyị na-ezi otu nwaanyị na nwa ya ozi oma n’obodo West Bengal dị n’India
Ihe I Nwere Ike Ikwu
ỤLỌ NCHE
Ajụjụ: Anyị niile na-achọ ka a kasie anyị obi mgbe ụfọdụ. Ma olee ebe anyị ga-esi enweta nkasi obi?
Amaokwu Baịbụl: 2 Kọr. 1:3, 4
Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu Ụlọ Nche a kọwara otú Chineke si akasi anyị obi.
ỤLỌ NCHE (peeji nke 16)
Ajụjụ: Ụfọdụ chere na Alaeze Chineke bụ ihe dị mmadụ n’obi; ndị ọzọ echee na ọ bụrụ na ụmụ mmadụ emee ka udo dịrị n’ụwa, na alaeze abịala. Gịnị ka i chere?
Amaokwu Baịbụl: Dan. 2:44
Otú a ga-esi enye ya: Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Isiokwu a ga-akọwa ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru banyere Alaeze Chineke.
NA-AKỤZI EZIOKWU
Ajụjụ: Olee otú anyị ga-esi amata ma ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?
Amaokwu Baịbụl: 1 Pita 5:7
Eziokwu: Chineke chọrọ ka anyị na-akọrọ ya mkpa anyị n’ekpere n’ihi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.