Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb16 Nọvemba p. 3
  • Baịbụl Kwuru Ihe Ndị E Ji Ama Ezigbo Nwunye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Kwuru Ihe Ndị E Ji Ama Ezigbo Nwunye
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụmọdụ Amamihe nke Otu Nne
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Onye Nwe Ya Bụ Onye A Ma Ama n’Ọnụ Ụzọ Ámá”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • ‘Nwoke Bụ Isi nke Nwaanyị’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
mwb16 Nọvemba p. 3

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ILU 27-31

Baịbụl Kwuru Ihe Ndị E Ji Ama Ezigbo Nwunye

E dere ihe dị ezigbo mkpa nne Eze Lemuel gwara Lemuel n’akwụkwọ Ilu isi 31. Ezigbo ndụmọdụ o nyere ya mere ka ọ mata ihe ndị o kwesịrị ịtụ anya n’aka nwaanyị ọ ga-alụ.

Ezigbo nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi

Ebe otu nwaanyị n’oge Baịbụl na-enye ezinụlọ ya nri

31:10-12

  • Ọ na-atụ aro ga-abara ezinụlọ ha uru. Ma, ọ naghị amanye di ya ime ihe o kwuru

  • Di ya na-ahapụ ya ka o mee mkpebi ụfọdụ n’onwe ya n’ihi na ọ tụkwasịrị ya obi na ọ ga-eme mkpebi dị mma

Ezigbo nwunye na-adị ike ọrụ

Ebe otu nwaanyị n’oge Baịbụl na-egwe ọka

31:13-27

  • Ọ naghị emefu ego aghara aghara ka o nwee ike inwe ihe ọ ga-eji na-eme ka ezinụlọ ha na-adị mma n’anya ma na-eriju afọ

  • Ọ na-arụsi ọrụ ike, na-elerukwa ezinụlọ ya anya mgbe niile

Ezigbo nwunye na-eji ofufe Chineke kpọrọ ihe

Ebe otu nwaanyị na-ekpe ekpere

31:30

  • Ọ na-atụ egwu Chineke, na-emekwa ihe ga-eme ka ya na Chineke na-adị ná mma

Ị̀ MAARA?

Nkume kọral nke na-acha uhie uhie dị oké ọnụ ahịa n’oge Baịbụl. Ọ mara mma, dịkwa ụkọ. A na-esi n’Oké Osimiri Mediterenian na n’Oké Osimiri Uhie enweta ya. N’oge ochie, ndị ahịa anaghị eji ya egwu egwu.

Nkume kọral na-acha uhie uhie

Baịbụl kwuru na nkume kọral bara ezigbo uru otú ahụ ọlaedo, ọlaọcha na safaya bara.

Okwu Chineke kwuru na ezigbo nwunye dị nnọọ oké ọnụ ahịa ‘karịa nkume kọral.’​—⁠Ilu 31:⁠10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya