OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Onye Nwe Ya Bụ Onye A Ma Ama n’Ọnụ Ụzọ Ámá”
Ezigbo nwaanyị na-eme ka di ya nwee aha ọma. N’oge Eze Lemuel, nwoke lụtara ezigbo nwaanyị na-abụ “onye a ma ama n’ọnụ ụzọ ámá.” (Ilu 31:23) N’oge anyị a, ọ bụ ụmụnna nwoke ndị a na-akwanyere ùgwù n’ọgbakọ na-abụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Ọ bụrụ na ha lụrụ nwaanyị, ihe ga-eme ka ha na-eje ozi ha bụ ma nwunye ha na-akpa àgwà ọma ma na-akwado ha. (1 Tim. 3:4, 11) Ha anaghị eji ndị nwunye ha ndị a na-akpa àgwà ọma egwu egwu. Ọgbakọ anaghịkwa eji ha egwu egwu.
Otú ezigbo nwaanyị ga-esi na-akwado di ya n’ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ bụ . . .
ịna-agba ya ume.—Ilu 31:26
ịna-enye ya ohere ịrụ ọrụ ọgbakọ.—1 Tesa. 2:7, 8
ịna-ebi ndụ dị mfe.—1 Tim. 6:8
ịghara ịna-aghụ di ya ọnụ ka ọ mata ihe ụfọdụ na-eme n’ọgbakọ ọ na-ekwesịghị ịma.—1 Tim. 2:11, 12; 1 Pita 4:15