AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 58-62
‘Kpọsaa Afọ Jehova Na-egosi Ihu Ọma Ya’
“Afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya” abụghị afọ nkịtị
Ọ bụ oge Jehova nyere ndị nwere ezi obi ohere ịbịa fee ya
N’oge Ndị Kraịst oge mbụ, afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya bidoro mgbe Jizọs malitere ozi ya n’afọ 29 ruo ‘n’ụbọchị Jehova bọrọ ọbọ ya,’ ya bụ, mgbe e bibiri Jeruselem n’afọ 70
N’oge anyị a, afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya bidoro mgbe Jizọs ghọrọ eze n’eluigwe n’afọ 1914. Ọ ga-agwụchakwa n’oké mkpagbu
Jehova ejirila ndị ahụ dị ka “oké osisi nke ezi omume” gọzie ndị ya
Osisi ndị kacha ogologo n’ụwa na-etokọta ọnụ n’ọhịa, osisi nke ọ bụla ana-enyere ibe ya aka ịkwụsi ike
Mgbọrọgwụ ha nwere ike ịhịkọta onwe ha, mee ka osisi ndị ahụ sie ike n’ala ma nwee ike iguzogide oké ifufe
Osisi ndị toro ogologo na-aghọrọ osisi ndị ka na-eto eto ndò, akwụkwọ ha dara n’ala na-emekwa ka ala na-eme nke ọma
Ndị niile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa na-erite uru n’aka ndị a bụ́ “oké osisi nke ezi omume,” ya bụ, ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa, n’ihi na ha na-elekọta ha ma na-echebe ha