Ebe ụmụnna anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị na Kuk Aịlandz
Ihe I Nwere Ike Ikwu
ỤLỌ NCHE
Ajụjụ: Ndị mmụọ ozi hà dị adị n’eziokwu?
Amaokwu Baịbụl: Ọma 103:20
Akwụkwọ: Ụlọ Nche a kọwara ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị mmụọ ozi na otú ihe ndị ha na-eme si gbasa anyị.
NA-AKỤZI EZIOKWU
Ajụjụ: Ì chere na sayensị akagbuola ihe Baịbụl kwuru?
Amaokwu Baịbụl: Aịza. 40:22
Eziokwu: Ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara sayensị bụ eziokwu.
AKWỤKWỌ ỊKPỌ ÒKÙ ỌMỤMỤ IHE (inv)
Akwụkwọ: O nwere okwu a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe anyị na-anọ efe Chineke. M na-akpọ gị ka ị bịa gere okwu ahụ n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. [Nyezie ya akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Gosi ya ebe e dere oge na ebe anyị na-enwe ọmụmụ ihe ngwụcha izu, gwakwa ya isiokwu okwu ihu ọha ahụ a ga-ekwu.]
Ajụjụ: Ị̀ bịatụla ọmụmụ ihe anyị mbụ? [I nwere ike ịkpọnyere ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?]
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.