OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ihe Chineke Kekọtara . . .”
Iwu Mozis kwuru na nwoke ọ bụla chọrọ ịgba nwunye ya alụkwaghịm kwesịrị ide akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. Iwu a mere ka ha ghara iji ọkụ ọkụ na-agba nwunye ha alụkwaghịm. Ma n’oge Jizọs, ndị ndú okpukpe mere ka ịgba alụkwaghịm dịrị ndị mmadụ mfe. Ha kwuru na nwoke nwere ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ihe ọ bụla. (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 10:4, 11) Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ Jehova malitere ma kwadoo ka a na-alụ di na nwunye. (Mak 10:2-12) Di na nwunye kwesịrị ịbụ “otu anụ ahụ́.” Ha ekwesịghị ịhapụ ibe ha. Naanị ihe Baịbụl kwuru nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm bụ “ịkwa iko.”—Mat. 19:9.
Taa, ọtụtụ ndị weere alụmdi na nwunye otú ahụ ndị Farisii si were ya, ọ bụghị otú Jizọs si were ya. Ha nwehaala nsogbu n’alụmdi na nwunye ha, ha agbaa alụkwaghịm ozugbo. Ma, Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye na-eji nkwa ha kwere ibe ha akpọrọ ihe. Ha nwee nsogbu, ha na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru iji dozie ya. Unu lechaa vidio bụ́ Ịhụnanya na Nkwanye Ùgwù Na-eme Ka Ezinụlọ Dịrị n’Otu, zaanụ ajụjụ ndị a:
Olee otú ị ga-esi mee ihe Ilu 15:1 kwuru n’alụmdi na nwunye gị, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ime ya?
Olee otú ime ihe e kwuru n’Ilu 19:11 ga-esi enyere gị aka ịgbara nsogbu ọsọ?
Ọ bụrụ na alụmdi na nwunye gị na-achọ itisa, kama ichewe ma ị̀ ga-agba alụkwaghịm, olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị?
Olee otú ime ihe e dere na Matiu 7:12 ga-esi enyere gị aka ịbụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye?