Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb19 Jenụwarị p. 7
  • ”Pọl Kelere Chineke Ma Nwee Obi Ike”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ”Pọl Kelere Chineke Ma Nwee Obi Ike”
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ha Na-agbasi Mbọ Ike Ka Ha Nwee Ike Ijere Anyị Ozi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị—Onyinye n’Ụdị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
mwb19 Jenụwarị p. 7
Pọl kelere Chineke maka ụmụnna ndị ahụ bịara izute ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Pọl Kelere Chineke Ma Nwee Obi Ike”

Mgbe ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị na Rom nụrụ na Pọl na-abịa, ha zipụrụ ụmụnna ụfọdụ ka ha gaa zute ya. Ụmụnna ndị ahụ mere njem ihe dị ka kilomịta iri isii na anọ iji zute ya. Olee otú obi dị Pọl maka ụdị ịhụnanya ụmụnna ndị a gosiri ya? Ọrụ 28:15 sịrị na “ozugbo Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma nwee obi ike.” Ọ bụ eziokwu na a ma Pọl ama ka onye na-aga n’ọgbakọ dị iche iche na-agba ha ume, ma, n’oge a ọ bụ onye mkpọrọ, ọ bụ yanwa ka a gbara ume.—2 Kọr. 13:10.

Taa, ndị nlekọta sekit na-aga n’ọgbakọ dị iche iche na-agba ụmụnna ume. Mgbe ụfọdụ, ike nwere ike ịna-agwụ ha, ha ana-echegbukwa onwe ha ma ọ bụkwanụ daa mbà n’obi, otú ahụ ọ na-adị onye ọ bụla na-efe Chineke. N’oge ọzọ onye nlekọta sekit na nwunye ya ga-abịa ileta ọgbakọ unu, gịnị ka i nwere ike ime iji nyere ha aka inwe obi ike, nakwa iji mee ka onye ọ bụla ‘na-agbarịta ibe ha ume.’—Rom 1:11, 12.

  • Ebe otu onye nlekọta na-eduzi nzukọ ozi ubi

    Na-abịa nzukọ ozi ubi. Onye nlekọta sekit na-enwe obi ụtọ ma ndị nkwusa agbalịa kwadoo ihe niile a na-eme n’izu ahụ ọ na-eleta ọgbakọ. (1 Tesa. 1:2, 3; 2:20) Lee ma i nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ onye nlekọta ga-abịa. Ì nwere ike ikwu ka gị na ya ma ọ bụ nwunye ya rụọ n’ozi ọma, ma ọ bụkwanụ ka gị na otu n’ime ha soro gaa mụọrọ mmadụ ihe? Ha na-enwe mmasị iso ndị nkwusa dị iche iche rụọ n’ozi ọma, ma ndị ọhụrụ ma ndị aka na-esichabeghị ike n’ikwusa ozi ọma.

  • Ebe otu ezinụlọ ji obi ụtọ na-anabata onye nlekọta sekit bịara na nke ha

    Lee ha ọbịa. Ì nwere ike ikwe ka ha biri n’ụlọ gị ma ọ bụ kpọọ ha ka ha bịa rie nri na nke gị? I mee otú ahụ, ha ga-amata na ị hụrụ ha n’anya. Ha anaghị atụ anya oké ihe n’aka gị.—Luk 10:38-42.

  • Ebe otu onye nlekọta na-eduzi nnọkọ ndị okenye

    Gee ya ntị, jirikwa ndụmọdụ ya kpọrọ ihe. Onye nlekọta sekit na-eji ịhụnanya achọ ka o nyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova. Cheta na mgbe ụfọdụ, o nwekwara ike ịdọ anyị aka ná ntị. (1 Kọr. 5:1-5) Obi na-adị ya ezigbo ụtọ ma ọ hụ na anyị na-erube isi.—Hib. 13:17.

  • Ebe ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ na-ekele nwunye onye nlekọta sekit ha

    Gosi na obi dị gị ụtọ n’ebe ha nọ. Gwa onye nlekọta sekit ahụ na nwunye ya otú ọbịbịa ha si baara gị uru. I nwere ike ịgwa ha ya ihu na ihu ma ọ bụkwanụ dee ya n’akwụkwọ ozi zigara ha.—Kọl. 3:15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya