OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Gịnị Ka I Nwere Ike Ịmụta n’Egwú Anyị Ndị Na-agba n’Ihe Omume Tiivi Anyị?
Olee ụfọdụ egwú ndị gbara n’ihe omume tiivi anyị kacha amasị gị? Oleekwa ihe mere ha ji amasị gị? Ị̀ chọpụtara na ihe ndị a na-egosi na vidio egwú ndị ahụ bụ ihe ndị anyị na-ahụ na-eme kwa ụbọchị? Isiokwu nke ọ bụla na-adị iche n’ibe ya, ụda egwú ha na-adịkwa iche iche. Ihe a mere ka a na-enwe nke ga-amasị onye ọ bụla. Ma, ihe mere e ji ewepụta egwú ndị a abụghị naanị ka ha na-atọ anyị ụtọ.
Egwú nke ọ bụla na-akụziri anyị ihe ndị ga-abara anyị uru n’ozi anyị, nakwa n’otú anyị si ebi ndụ. Ụfọdụ n’ime ha na-ekwu banyere ile ọbịa, ịdị n’otu, imeta ezi ndị enyi, inwe obi ike, ịhụnanya ma ọ bụkwanụ inwe okwukwe. Ndị ọzọ na-ekwu banyere ịlọghachikwute Jehova, ịgbaghara ndị ọzọ, ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, na ijekwuru Jehova ozi. E nwedịrị egwú nke kwuru gbasara otú anyị ga-esi jiri ekwentị anyị na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Olee ihe ndị ọzọ dị mkpa egwú anyị ndị a kụziirila gị?
LEENỤ VIDIO EGWÚ BỤ́ N’EGBUGHỊ OGE Ọ BỤLA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu di na nwunye ahụ merela agadi nọ na-eche banyere ha?—Jen. 12:3
Gịnị ka anyị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na Jehova ga-emezu nkwa ya?
Olee ndị anyị na-atụ anya ịhụ n’oge na-adịghị anya?
Olee otú olileanya anya anyị nwere maka Alaeze Chineke si eme ka anyị na-edi nsogbu ndị anyị na-enwe?—Rom 8:25