MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ihe Gị Na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta
Mkparịta Ụka nke Mbụ
Ajụjụ: Chineke ọ̀ na-aza ekpere?
Amaokwu Baịbụl: Ọma 65:2
Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee ihe ndị anyị nwere ike ikpe n’ekpere?
EBE Ị GA-AHỤ AMAOKWU A N’AKWỤKWỌ ANYỊ JI AKỤZI IHE:
Nletaghachi
Ajụjụ: Olee ihe ndị anyị nwere ike ikpe n’ekpere?
Amaokwu Baịbụl: 1 Jọn 5:14
Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee otú Chineke si aza anyị ekpere?
EBE Ị GA-AHỤ AMAOKWU A N’AKWỤKWỌ ANYỊ JI AKỤZI IHE:
Ịkpọ Ndị Mmadụ Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs (Febụwarị 27–Mach 27)
“Anyị na-akpọ gị [ma ọ bụ na-ezitere gị ozi a] ka ị bịa otu nnọkọ pụrụ iche ọtụtụ nde mmadụ ga-abịa. Ọ bụ ncheta ọnwụ Jizọs.” Nye onye ahụ [ma ọ bụ zigara ya] akwụkwọ ịkpọ òkù. “Ị ga-ahụ oge na ebe anyị ga-anọ eme ya n’akwụkwọ a [ma ọ bụkwanụ otú ị ga-esi esi n’Ịntanet soro mee ya]. Anyị na-akpọkwa gị maka okwu a ga-eji Baịbụl kwuo n’izu bu ya ụzọ.”
Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ ma O Nwee Mmasị: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?