Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb21 Nọvemba p. 9
  • Olee Otú Ụmụnna Nwaanyị Nwere Ike Isi Na-enyekwu Aka n’Ozi Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ụmụnna Nwaanyị Nwere Ike Isi Na-enyekwu Aka n’Ozi Jehova?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-akwado Ụmụnna Nwaanyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ị̀ Na-emeso Ụmụ Nwaanyị Otú Jehova Si Emeso Ha?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • ‘Ndị Inyom Ndị Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ n’Ime Onyenwe Anyị’
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Nwere Ike Isi Jekwuoro Jehova Ozi
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
mwb21 Nọvemba p. 9
Foto ndị na-egosi: Ebe ụmụnna nwaanyị ji ọṅụ na-arụ ọrụ dị iche iche. 1. Ebe otu nwanna nwaanyị nọ n’ozi ọma. 2. Ebe otu nwanna nwaanyị so na-arụ ụlọ ndị anyị na-anọ efe Jehova. 3. Ebe otu nwanna nwaanyị na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. 4. Ebe otu nwanna nwaanyị na-egosi nwanna nwaanyị mere agadi otú e si apị tablet. 5. Ebe otu nwanna nwaanyị na-enyere nwa ya aka ka ọ zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe. 6. Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ nọ n’ozi ọma n’oge oyi.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Otú Ụmụnna Nwaanyị Nwere Ike Isi Na-enyekwu Aka n’Ozi Jehova?

Ụmụnna nwaanyị na-arụ ọrụ bara ezigbo uru n’ozi Alaeze Chineke. (Ọma 68:11) Ha na-eduzi ọtụtụ n’ime ọmụmụ Baịbụl ndị Jehova na-eduzi taa. Ọtụtụ n’ime ndị ọsụ ụzọ oge niile bụ ụmụnna nwaanyị. E nwekwara ọtụtụ puku ụmụnna nwaanyị na-arụsi ọrụ ike n’ozi Betel, n’ozi ala ọzọ, n’ịrụ ụlọ ndị anyị na-anọ efe Jehova, nakwa n’ịsụgharị akwụkwọ anyị dị iche iche. Ụmụnna nwaanyị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ na-agbakwa ndị ezinụlọ ha na ụmụnna ha ume. (Ilu 14:1) Ọ bụ eziokwu na ụmụnna nwaanyị agaghị abụli ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi, ma e nwere ihe ndị ha nwere ike ikpebi imekwu n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwaanyị, olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi na-enyekwu aka n’ozi Jehova?

  • Mụta ịna-akpa àgwà ọma e ji mara Ndị Kraịst.​—1 Tim. 3:11; 1 Pita 3:​3-6

  • Jiri ihe ndị ị mụtarala n’ọgbakọ nyere ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ aka.​—Taị. 2:​3-5

  • Mee ka otú i si ezi ozi ọma na-akakwu mma, jirikwa oge buru ibu na-ekwusa ozi ọma

  • Mụọ asụsụ ọzọ

  • Kwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma

  • Tinye akwụkwọ maka ije ozi na Betel ma ọ bụ inye aka na-arụ ụlọ ndị anyị na-anọ efe Jehova

  • Tinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze

LEENỤ VIDIO BỤ́ “ỤMỤ NWAANYỊ NA-ARỤSI ỌRỤ IKE N’IME ONYENWE ANYỊ,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú ihe nwanna nwaanyị nke ọ bụla kwuru si gbaa gị ume?

Foto ụmụnna nwaanyị atọ ndị ahụ e gosiri na vidio “Ụmụ Nwaanyị Na-arụsi Ọrụ Ike n’Ime Onyenwe Anyị.”
    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya