OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ndị Na-eto Eto, Na-akọrọnụ Ndị Mụrụ Unu Obi Unu
Gịnị mere i kwesịrị iji na-akọrọ ndị mụrụ gị obi gị? (Ilu 23:26) Ọ bụ n’ihi na Jehova nyere ha ọrụ ịna-elekọta gị na ịna-eduzi gị. (Ọma 127:3, 4) Ọ ga-esiri ha ike inyere gị aka ma ọ bụrụ na ị na-ezochiri ha ihe ndị gị na ha na-alụ. O nweghịkwa otú ha ga-esi akọrọ gị ihe ndị ha mụtarala ga-abara gị uru. Ọ̀ bụ ihe ọjọọ ma i kpebie na ị gaghị akọrọ ha ihe ụfọdụ? Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụhaala na ihe mere i ji na-eme ya abụghị iji ghọgbuo ha. —Ilu 3:32.
Olee otú ị ga-esi na-akọrọ ndị mụrụ gị obi gị? Họrọ oge ga-adabara gị na ha. Ọ bụrụ na nke ahụ ga-esitụ ike omume, i nwere ike idere otu n’ime ha akwụkwọ ozi kọọrọ ya obi gị. Ọ bụrụ na ha chọrọ ka unu kwurịta otu ihe ị na-enweghị mmasị ikwurịta, cheta na ha chọrọ inyere gị aka. Were nne gị na nna gị ka ndị enyi gị, ọ bụghị ndị iro gị. Mbọ ọ bụla ị gbara ka gị na ndị mụrụ gị kwurịta okwu ga-abara gị uru ná ndụ gị niile, ruokwa mgbe ebighị ebi.—Ilu 4:10-12.
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE MERE MGBE M NA-ETO ETO—OLEE OTÚ M GA-ESI EME KA MỤ NA MPA M NA MMA M NA-EKWURỊTA OKWU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị ka Esther na Partik mechara mata banyere onwe ha?
Olee ihe i nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs mere?
Olee otú ndị mụrụ gị sirila gosi na ha hụrụ gị n’anya?
Ndị mụrụ gị chọrọ ka ihe gaziere gị
Olee ndụmọdụ Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ịgwa ndị mụrụ gị okwu?