Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb23 Julaị p. 11
  • Ị Ga-emeli Ka Ezinụlọ Unu Na-enwekwu Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Ga-emeli Ka Ezinụlọ Unu Na-enwekwu Obi Ụtọ
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụmọdụ Amamihe nke Otu Nne
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ịdọ Aka ná Ntị Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Jiri Ndụmọdụ Ndị Dị na Baịbụl Nyere Ụmụ Gị Aka Ịna-eme Nke Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
mwb23 Julaị p. 11
Foto ndị na-egosi: Ihe osise ndị si na vidio bụ́ “Na-enwe Ọṅụ n’Ezinụlọ Gị.” 1. Ebe ụmụ agbọghọ na-ele ka papa ha na mama ha na-ata keeki. 2. Ebe ụmụ agbọghọ na-amụmụ ọnụ ọchị n’ofufe ezinụlọ ha. 3. Ebe otu n’ime ụmụ aghọghọ ahụ na-elekọta mama ha ahụ́ na-adịghị ka o dina n’oche.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị Ga-emeli Ka Ezinụlọ Unu Na-enwekwu Obi Ụtọ

Jehova chọrọ ka ezinụlọ niile na-enwe obi ụtọ. (Ọma 127:3-5; Ekli. 9:9; 11:9) Ma, nsogbu ụwa na ihe ndị ezinụlọ anyị na-anaghị emeta nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ. Gịnị ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ga-eme ka obi ụtọ na-adịkwu n’ezinụlọ?

Di kwesịrị ịna-akwanyere nwunye ya ùgwù. (1 Pita 3:7) O kwesịrị ịna-ewepụta oge ya na nwunye ya ga-eji na-anọ. O kwesịghị ịtụwa anya ka nwunye ya mee ihe ndị ọ na-agaghị emeli, kama, ọ ga na-ekele ya maka mbọ ọ na-agbara ya na ezinụlọ ha. O kwesịkwara ịna-egosi ya na ọ hụrụ ya n’anya ma na-eto ya.​—Ilu 31:28, 31.

Nwunye kwesịrị ịna-achọ ụzọ ndị ọ ga-esi na-akwado di ya. (Ilu 31:12) O kwesịrị ịna-edo onwe ya n’okpuru di ya ma na-akwado ya. (Kọl. 3:18) O kwesịkwara ịna-eji olu ọma agwa di ya okwu, na-ekwukwa okwu ọma banyere ya.​—Ilu 31:26.

Ndị nne na nna kwesịrị ịna-ewepụta oge ha na ụmụ ha ga-eji na-anọ. (Diut. 6:6, 7) Ha ga na-agwa ụmụ ha na ha hụrụ ha n’anya. (Mat. 3:17) Ha dọwa ụmụ ha aka ná ntị, ha kwesịrị iji ịhụnanya na nghọta na-eme ya.​—Efe. 6:4.

Ụmụ kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị mụrụ ha ma na-erubere ha isi. (Ilu 23:22) Ha ga na-akọrọ ndị mụrụ ha obi ha. Ha kwesịkwara ịnabata aka ná ntị nne na nna ha na-adọ ha ma na-akwanyere ha ùgwù.​—Ilu 19:20.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ N’EZINỤLỌ GỊ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Gịnị ka onye nke ọ bụla mere iji hụ na ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya