OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ | KPEBIE IHE NDỊ Ị GA-EME N’AFỌ IJE OZI NA-ABỊANỤ
Ịsụ Ụzọ
Ikpebi ihe ndị anyị ga-emekwu n’ozi Jehova ga-eme ka anyị jiri ike anyị na-eme ihe ndị bara uru. (1 Kọr. 9:26) Ọ ga-emekwa ka anyị jiri obere oge fọrọ tupu e bibie ụwa a mee ihe bara uru. (Efe. 5:15, 16) Unu nwewe ofufe ezinụlọ, unu nwere ike ikwu ihe ndị unu ga-eme n’afọ ije ozi na-abịanụ. N’akwụkwọ usoro ihe omume a, e nwere isiokwu ndị kwuru ihe ụfọdụ i nwere ike ime n’afọ ije ozi na-abịanụ. Biko, tụlee ihe ndị ahụ nke ọma, kpeekwa ekpere banyere ha.—Jems 1:5.
Dị ka ihe atụ, leenụ ma ùnu ga-agbakọ aka kwadoo ka otu onye n’ezinụlọ unu bụrụ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ ma ị̀ ga-arụzulikwa awa gị, gwa ndị ọsụ ụzọ ụfọdụ ọnọdụ gị na ha yiri ka ha tụọrọ gị aro. (Ilu 15:22) Unu nwedịrị ike ịgwa otu ọsụ ụzọ ka ọ kọtụrụ unu ihe ụfọdụ n’oge ofufe ezinụlọ unu. E mechaa, gị edetuo ụzọ ụfọdụ ị haziri i nwere ike isi rụzuo awa gị. Ọ bụrụ na ị rụbuola ọrụ ọsụ ụzọ n’oge gara aga, lee ma ọnọdụ gị ọ̀ ga-ekwe gị ịrụ ya ọzọ ugbu a.
Ụfọdụ ndị ezinụlọ unu hà ga-asụli ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karịa? Ọ bụrụ na ike adịchaghịzi gị, ị ka nwekwara ike ịsụ ụzọ inyeaka. I nwere ike ịna-eji naanị ntakịrị oge aga ozi ọma kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ị gaghị enwe ike iji oge buru ibu gaa ozi ọma n’etiti izu n’ihi ọrụ gị ma ọ bụ n’ihi na ị na-aga akwụkwọ, i nwere ike ịhọrọ ịsụ ụzọ n’ọnwa a ga-enwe oge ezumike ma ọ bụ n’ọnwa nwere ngwụcha izu ise. Dee mgbe ị ga-achọ ịsụ ụzọ inyeaka na kalenda, deekwa otú ị haziri ị ga-esi arụzu awa gị.—Ilu 21:5.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NWEE OBI IKE . . . ONYE ỌSỤ ỤZỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị ka akụkọ Nwanna nwaanyị Aamand na-akụziri anyị banyere otú Jehova si elekọta ndị hapụrụ ihe ụfọdụ iji na-asụ ụzọ oge niile?