OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ihe Ndị Bara Uru Dị n’Akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi
Vidio ndị n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na ajụjụ ndị dị na ya e ji amata ihe mmadụ chere hà na-amasị gị? Ihe ndị ọzọ dị n’akwụkwọ a, dị ka “Ụfọdụ Na-asị,” “Ihe Ị Ga-agba Mbọ Mee,” na “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya,” hà na-amasị gị? Olee ihe ndị ọzọ dị n’akwụkwọ a nwere ike inyere gị aka mgbe ị na-amụrụ mmadụ Baịbụl?—Mat. 28:19, 20.
Akwụkwọ na Vidio: Ọ bụrụ na ọ kara gị mma iji nke e biri ebi na-amụrụ ndị mmadụ ihe, olee ebe ị ga-enweta vidio na akwụkwọ niile gbara n’ebe unu na-amụ? Ị gaa ná nke dị n’ekwentị ma ọ bụ na kọmputa, họrọ otu n’ime nkebi anọ e nwere n’akwụkwọ a. N’okpuru ebe e depụtara isiokwu niile dị ná nkebi nke ị họọrọ, ị ga-ahụ ebe ị ga-apị aka nweta akwụkwọ na vidio ndị gbara na ya. (Lee foto nke 1.)
Otú “Nke E Biri Ebi” dị: Ọ bụrụ na i ji ekwentị ma ọ bụ na kọmputa na-amụrụ mmadụ ihe, o nwere ike ịbara gị uru ma i jiri ekwentị gị na-emeghe “Nke E Biri Ebi” mgbe ụfọdụ. Ị chọọ ịhụ ya, pịa kpọm kpọm atọ dị n’elu elu aka nri ebe unu na-amụ, gị apịzie “Nke E Biri Ebi” (Printed Edition). Ịhụ otú e si hazie akwụkwọ a ga-eme ka ị na-echeta otú ihe unu na-amụ si gbasa isi ihe isiokwu unu nọ na ya na-ekwu. Ị chọọ ka ekwentị gị gosiwekwa gị nke na-adị n’ekwentị ma ọ bụ kọmputa, pịa kpọm kpọm atọ dị n’elu elu aka nri ebe unu na-amụ, gị apịzie “Nke Na-adị na Kọmputa” (Digital Edition).
“M̀ Dịla Njikere?”: Igbe ndị dị n’ebe ngwụcha ngwụcha akwụkwọ a kwuru ihe ndị ga-eme ka mmadụ ruo eruo iso ọgbakọ na-ekwusa ozi ọma na ime baptizim. (Lee foto nke 2.)
Ihe Ndị E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A: E nwere ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ a kọwakwuru n’ebe a. I jiri ekwentị gị ma ọ bụ kọmpụta gị meghee ebe a, n’okpuru ihe ahụ a kọwakwuru, ị ga-ahụ ihe ị ga-apị aka ga-ebughachi gị n’isiokwu unu na-amụ n’akwụkwọ a. (Lee foto nke 2.)
Hụ na ị mụchaara onye ị na-amụrụ ihe akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, ọ bụrụgodị na o meela baptizim. Ị ka nwere ike ịna-agụrụ awa, nletaghachi, na ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na onye nkwusa so gị mụọrọ ya ihe, o nwekwara ike ịgụrụ awa