Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb23 Jenụwarị p. 11
  • Na-agbalị Ka Ị Mata Ihe Bụ́ Echiche Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-agbalị Ka Ị Mata Ihe Bụ́ Echiche Chineke
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Na-eme Mkpebi Ga-eme Jehova Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ịgụ Baịbụl Kwa Ụbọchị na Ịchọ Amamihe
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ndị Mụrụ Ụmụ, Na-akụzirinụ Ụmụaka Unu Otú Ha Ga-esi Na-eme Chineke Obi Ụtọ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
mwb23 Jenụwarị p. 11
Foto si na vidio bụ́ “Ka Anyị Jiri ‘Ntachi Obi Na-agba Ọsọ’​—Na-eri Nri Na-edozi Ahụ́.” Ebe Rebekah ji broshọ Bekee bụ́ “The Origin of Life​—Five Questions Worth Asking” na-eme nchọnchọ.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-agbalị Ka Ị Mata Ihe Bụ́ Echiche Chineke

Anyị chọrọ ịna-eme ihe dị Jehova mma n’ihe niile anyị na-eme. (Ilu 27:11) Anyị ga na-eme otú ahụ ma anyị na-eme mkpebi ndị dabara n’echiche ya, ọ bụrụgodị mgbe a na-enweghị iwu a kapịrị ọnụ e nyere banyere ihe anyị chọrọ ime. Gịnị ga-enyere anyị aka ime ya?

Na-amụchi Baịbụl anya. Mgbe ọ bụla anyị na-agụ Baịbụl, ọ na-adị anyị ka anyị na Jehova ọ̀ nọ. Anyị ga-amata otú Jehova si eche echiche ma anyị mụọ gbasara otú o si mesoo ndị ya ihe n’oge ochie nakwa ma anyị mụọ gbasara ndị mere ihe ọ na-achọ na ndị na-emeghị ihe ọ na-achọ. Anyị chọzie ime mkpebi, mmụọ nsọ ga-echetara anyị ihe ndị dị mkpa anyị mụrụ n’Okwu Chineke.​—Jọn 14:26.

Na-eme nchọnchọ. Ị chọwa ime mkpebi, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee amaokwu Baịbụl ma ọ bụ akụkọ dị na Baịbụl ga-enyere m aka ịghọta echiche Jehova n’okwu a?’ Rịọ Jehova ka o nyere gị aka, jirikwa ihe ndị nzukọ a wepụtara e ji eme nchọnchọ n’asụsụ gị chọta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma.​—Ọma 25:4.

LEENỤ VIDIO BỤ́ KA ANYỊ JIRI “NTACHI OBI NA-AGBA ỌSỌ”​—NA-ERI NRI NA-EDOZI AHỤ́, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu ndị bịaara nwanna nwaanyị a anyị hụrụ na vidio a?

  • Olee otú ị ga-esi jiri ihe ndị anyị ji eme nchọnchọ chọta ihe ndị ga-enyere gị aka imeri ụdị nsogbu ndị ahụ?

  • Olee uru iwepụta oge mee nchọchọ na ịmụ ihe tupu anyị emewe mkpebi ga-abara anyị?​—Hib. 5:13, 14

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya