Gịnị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?
Ọtụtụ ndị kweere na ọ bụ akara aka ma ọ bụ inwe ihu ọma ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma. N’ihi ya, ha na-eme ihe dị iche iche ha chere ga-eme ka ha nwee ihu ọma.
IHE ỌTỤTỤ NDỊ KWEERE
IJI KPAKPANDO AKỌ IHE GA-EME N’ỌDỊNIHU: Ụfọdụ ndị kweere na ọ bụ otú kpakpando si nọrọ mgbe a mụrụ mmadụ na-ekpebi otú ihe ga-adịrị onye ahụ n’ọdịnihu. N’ihi ya, ha na-akpọtụrụ ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ka ndị ahụ gwa ha ihe ga-eme ha iji mara otú ha ga-esi gbaara nsogbu ọsọ ma ọ bụ ka ihe gaziere ha.
FENG SHUI: E nwere ndị kweere na e nwere otú ha ga-esi rụọ ụlọ ha, ya emee ka ihe dịrị ha ná mma. Otu nwoke aha ya bụ Lo Wing,a bi na Họng Kọng sịrị, “Otu ọkachamara n’ime feng shui gwara m na e nwere ebe m ga-edosa otu ụdị nkume pụrụ iche n’ụlọ ahịa m, mụ ana-ere ezigbo ahịa.”
IFE NDỊ NNA OCHIE OFUFE: E nwekwara ndị kweere na ha kwesịrị ịna-achụrụ ndị nna nna hà nwụrụ anwụ ma ọ bụ chi ha àjà ka ndị nna nna hà ma ọ bụ chị ha na-echebe ha ma na-agọzi ha. Otu nwaanyị bi na Vietnam aha ya bụ Van sịrị, “M kweere na m na-achụrụ ndị nna nna m nwụrụ anwụ àjà, ihe ga-adịrị mụ na ụmụ m mma, ma ugbu a ma n’ọdịnihu.”
ỊLỌ ỤWA: Ọtụtụ ndị kweere na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ na-alọ ụwa, ọ lọ ụwa nwụọ, ya alọkwa ụwa ọzọ. Ha kwekwaara na ihe ọma na-emere ha ugbu a ma ọ bụ ihe ọjọọ na-eme ha bụ maka ihe ha mere n’ụwa ha mbụ.
Ọtụtụ ndị weere ihe ndị a ka nkwenkwe ụgha. Ma, ha na-ele akara aka, na-agakwuru ndị na-akọ nrọ, ma na-aga n’enyo ka ha mata otú ihe ga-adị n’ọdịnihu. Ha na-eche na ha ga-esi n’ihe ndị a amata otú ihe ga-adịrị ha n’ọdịnihu.
IHE NDỊ A HÀ NA-ENYERE NDỊ MMADỤ AKA N’EZIOKWU?
Ihe ndị a ndị mmadụ kweere na ihe ndị a ha na-eme, hà emeela ka ihe na-agaziri ha ugbu a, obi esiekwa ha ike na ha agaghị enwe nsogbu n’ọdịnihu?
Chegodị gbasara ihe mere otu nwoke bi na Vietnam aha ya bụ Hào. Ọ na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, na-eme feng shui, na-efekwa ndị nna ya ochie ofufe. Ihe ndị a hà mere ka ihe dịrị ya ná mma? Hào sịrị, “Ahịa m dara, mụ ekoro ụgwọ, udo adịghịkwa n’ezinụlọ m, obi ana-ajọkwa m njọ.”
Otu nwoke onye Taịwan aha ya bụ Qiuming kwekwaara n’iji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, n’ịlọ ụwa, n’akara aka, na feng shui, nakwa n’ife ndị nna ochie ofufe. Ma, mgbe o lebachara ihe ndị a niile anya nke ọma, o kwuru, sị: “Achọpụtara m na ndị kweere n’ihe ndị a na ibe ha anaghị enwe otu olu, ihe ndị a anaghịkwa edo ndị mmadụ anya. Achọpụtakwara m na ọtụtụ mgbe, ihe ndị e ji kpakpando kọọ na ha ga-eme anaghị emecha mee. A bịa n’ịlọ ụwa, ọ bụrụ na mmadụ anaghị echeta otú o si bie ndụ n’ụwa ya mbụ, olee otú ọ ga-esi agbanwe ndụ ya ugbu a ka o ka nke o biri na mbụ mma?”
“Achọpụtara m na ndị kweere n’ihe ndị a na ibe ha anaghị enwe otu olu, ihe ndị a anaghịkwa edo ndị mmadụ anya.”—QIUMING, TAỊWAN
Hào, Qiuming, na ọtụtụ ndị ọzọ achọpụtala na ihe na-ekpebi otú ihe ga-adịrị anyị n’ọdịnihu abụghị akara aka, kpakpando, ndị nna nna anyị nwụrụ anwụ, ma ọ bụ ịlọ ụwa. Ma, ihe a ọ̀ pụtara na o nweghị ihe anyị ga-emeli ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu?
Ọtụtụ ndị chere na ihe ha ga-eme iji hụ na ihe dịịrị ha ná mma n’ọdịnihu bụ ịgụ oké akwụkwọ na inwe ego. Ma, olee otú imi na anya dị ụfọdụ ndị mere otú ahụ?
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a na n’isiokwu ndị na-esonụ abụghị ezigbo aha ha.
b Ihe a o kwuru dị n’Akwụkwọ Nsọ ná Ndị Galeshia 6:7. E nwekwara ihe ndị Eshia na-ekwukarị yiri ya. Ha na-asị na onye kụọ egwusi, ya aghọrọ egwusi, onye kụọ àgwà, ya aghọrọ àgwà.