Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 5/15 p. 3-4
  • Ì Kwere n’Ịlọ Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Kwere n’Ịlọ Ụwa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Kwesịrị Ikwere n’Ịlọ Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ì Kweere na Ị Dịbuola Ndụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Echiche ahụ Abanye n’Okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Mgbaasị na Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Ọnọdụ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 5/15 p. 3-4

Ì Kwere n’Ịlọ Ụwa?

“Ì CHETARA nwa agbọghọ ahụ bidewere gị nke gị na ya na-atọ mgbe unu na-etolite n’ebe a n’India?” ka Mukundbhai degaara nwa ya nwoke, bụ́ nwa akwụkwọ n’otu mahadum dị na United States. “Ọ na-aga ịlụ di n’ime izu ole na ole. Echere m na i kwesịrị ịma.”

Gịnị mere nna ahụ ji kọọrọ nwa ya nwoke akụkọ a? E kwuwerị, Mukundbhai ji aka ike kwụsị mmekọrịta ịhụnanya ahụ nke ndị ahụ nọ n’afọ iri na ụma ọtụtụ afọ gara aga. E wezụga nke ahụ, nwa ya nwoke anọwo na United States na-achụso mmụta ka elu eri afọ isii. Ya na nwa agbọghọ ahụ ezirịtabeghị ozi n’ime oge ahụ, Mukundbhai makwa nke ahụ.

Mgbe ahụ, gịnị mere o ji echegbu onwe ya? Ọ bụ n’ihi na Mukundbhai kwere n’ịlọ ụwa, ma ọ bụ mmụghachi.a Ọ bụrụ na ọ dabara na ndọrọ nwata na ibe ya ahụ dịịrị n’etiti ha abụọ bụrịị n’ihi na ha bụ di na nwunye ná ndụ ndị mbụ, ọ ga-abụ ihe obi ọjọọ ikewa ha ugbu a ha ruworo ogo ịlụ. Mukundbhai chọrọ nanị ime ka nwa ya nwoke mara ihe na-emenụ tupu nwa agbọghọ ahụ aghọọ nwunye onye ọzọ n’ụwa nke a ha lọrọ.

Tụlee ọnọdụ ọzọ. Otu nwa nwanyị dị afọ anọ anọwo ná nhụjuanya ọtụtụ ugboro n’otu ụlọ ọgwụ dị na Mumbai, India. Nsogbu ya bụ otu valvụ na-adịghị arụzi ọrụ n’obi ya. Ndị mụrụ ya bụ aka ji akụ̀ enweghị ike idi ịhụ ka nwa ha na-ata ahụhụ. Ma ha tụgharịrị n’uche, sị: “Anyị aghaghị ịnakwere ya. Ọ ghaghị ịbụ na o mewo ihe ná ndụ ya mbụ iji kwesị inweta ihe a.”

Ikwere n’ịlọ ụwa na-ekere òkè dị mkpa ná ndụ ọtụtụ nde ndị okpukpe Hindu, okpukpe Buddha, okpukpe Jain, okpukpe Sikh, na okpukpe ndị ọzọ malitere n’India. Ahụmahụ ndị dị ná ndụ—site n’ịdaba n’ịhụnanya ruo n’ịta oké ahụhụ—bụcha ihe a na-ewere dị ka ihe si n’ihe ndị e mere n’otu ụwa ma ọ bụ ọtụtụ ụwa mbụ pụta.

Ọtụtụ ndị n’ala Ọdịda Anyanwụ nwekwara oké mmasị na nkwenkwe nke ịlọ ụwa. Nwanyị America na-eme ihe nkiri bụ́ Shirley MacLaine na-ekwu na ya kwere na ya. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Laurel Phelan nke Vancouver, British Columbia, Canada, na-azọrọ na ya na-echeta ugboro 50 ọ lọrọ ụwa n’oge gara aga. N’otu njụta echiche Gallup e mere maka CNN/USA Today, ihe karịrị ndị toworo ogo mmadụ 270 n’ime 1,016 kwuru na ha kwere n’ịlọ ụwa. Ikwere n’ịlọ ụwa bụkwa akụkụ nke òtù Ọgbọ Ọhụrụ ahụ. Ma ihe àmà dị aṅaa na-akwado nkwenkwe nke a?

“Ncheta nke ụwa mbụ!” ka ndị kwere n’ịlọ ụwa na-aza. N’ihi ya, mgbe Ratana dị afọ atọ na Bangkok malitere “icheta ụwa ya gara aga dị ka nwanyị ji okpukpe kpọrọ ihe nke nwụrụ n’afọ ndị 60 ya,” ọtụtụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ nakweere ọnọdụ ya dị ka ezi ihe nnwapụta nke ịlọ ụwa.

Otú ọ dị, inwe obi abụọ zuru ebe nile. O kwekwara omume inwe nkọwa ndị ọzọ nke ncheta a sị na o si n’ụwa mbụ.b N’akwụkwọ ya bụ́ Hinduism: Its Meaning for the Liberation of the Spirit, onye ọkà ihe ọmụma Hindu bụ́ Nikhilananda na-ekwu na ‘a pụghị iji ikike nghọta nwapụta ahụmahụ ndị a na-enwe mgbe a nwụsịrị.’ Ma ọ na-ekwu na “nkwenkwe nke mmụghachi pụrụ ikwe omume karịa ịbụ ihe na-apụghị ikwe omume.”

Ma Bible ọ̀ na-akwado nkụzi a? Olileanya dịkwa aṅaa maka ndị nwụrụ anwụ ka Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ na-enye?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “Ịlọ ụwa,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, pụtara “mmụghachi nke mkpụrụ obi n’otu ịdị adị ma ọ bụ karị sochiri ibe ya, nke pụrụ ịbụ mmadụ, anụmanụ, ma ọ bụ, n’ọnọdụ ụfọdụ, ihe ọkụkụ.” E jikwa okwu ahụ bụ́ “mmụghachi” eme ihe iji kọwaa ihe omume a, ma a na-anakwere okwu ahụ bụ́ “ịlọ ụwa” karị. Ọtụtụ akwụkwọ ọkọwa okwu n’asụsụ India ji okwu ndị ahụ eme ihe n’ụzọ mgbanwerịta.

b Lee peji nke 22-24 ná mbipụta Teta! nke September 8, 1994.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

À na-enye ya ahụhụ n’ihi mmehie ndị o mere n’ụwa mbụ ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya