Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp21 nke 3 p. 15
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI AHỤ JEHOVA N’ANYA MA NA-EGE NTỊ N’OLU YA?
  • Ọdịnihu Gị Dị Gị n’Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • I Nwere Ike Ịbụ Enyị Chineke
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • “Ndị Dị Umeala n’Obi Ga-enweta Ụwa”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Okwu mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
wp21 nke 3 p. 15
Ebe otu nwoke nọ n’ebe a na-aṅụ kọfị na-egosi enyi ya ihe dị n’ekwentị ya.

Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu

Ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, Jehova Chineke gwara ndị na-efe ya ihe ha ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma. Ọ gwara ha, sị: “Agwala m unu ihe abụọ unu ga-ahọrọ otu n’ime ha. Ha bụ ndụ na ọnwụ, ka a gọzie unu ma ọ bụ ka a bụọ unu ọnụ. Unu ga-ahọrọ ndụ ka unu wee dịrị ndụ, unu na ụmụ unu.”—Diuterọnọmi 30:19.

Ha chọọ ka ihe dịrị ha ná mma, ha ga na-eme ihe Chineke chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ihe anyịnwa kwesịrị ime. Baịbụl gwara anyị ihe anyị ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu. Ọ sịrị: “Otú unu ga-esi eme ya bụ na unu ga-ahụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya, na-ege ntị n’olu ya.”—Diuterọnọmi 30:20.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI AHỤ JEHOVA N’ANYA MA NA-EGE NTỊ N’OLU YA?

NA-AMỤ BAỊBỤL: Ka i nwee ike ịhụ Jehova n’anya, ị ga-ebu ụzọ mụọ Baịbụl ka ị mata onye ọ bụ. Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-achọpụta na ọ hụrụ gị n’anya nakwa na ọ chọrọ ka ihe dịrị gị ná mma. Ọ chọrọ ka ị na-ekpegara ya ekpere ‘n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na ị gbaa mbọ bịaruo Chineke nso, ‘ọ ga-abịarukwa gị nso.’—Jems 4:8.

NA-EME IHE NDỊ Ị MỤTARA NA BAỊBỤL: Ige Chineke ntị pụtara ịna-eme ihe ndị ị mụtara na Baịbụl. Ị na-eme otú ahụ, ‘ihe ga na-agaziri gị, ị ga na-akpakwa àgwà ka onye ma ihe.’—Joshụa 1:8.

Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-akụzi, gaa na jw.org. I nwere ike ịnọ ebe ahụ gụọ Baịbụl, mata azịza ajụjụ ndị a zara na Baịbụl, ma ọ bụ dejupụta fọm ka Onyeàmà Jehova mụwara gị Baịbụl.

Kwe ka Baịbụl mee ka ị mata ihe ị ga-eme ka ihe nwee ike ịdịrị gị ná mma n’ọdịnihu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya