Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp22 nke 1 p. 3
  • Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Ji Akpọ Ibe Ha Asị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Okwu Mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị Kpamkpam
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Ndị A Kpọrọ Asị Juru Ebe Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
wp22 nke 1 p. 3
Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwoke obi gbawara na-echegbu onwe ya gbasara otú ịkpọasị si ju ebe niile. 1. Ebe otu nwaanyị ji ekwentị n’aka na-abara ya mba. 2. Ebe nwaanyị ọzọ na-eleda ya anya. 3. Ebe otu nwoke na-agụ akwụkwọ akụkọ na-ele ya anya ọjọọ. 4. Nwoke na-agụ akụkọ ụwa na tiivi.

Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị

È nwetụla mgbe mmadụ kpọrọ gị asị?

Ọ bụrụ na e nwetụbeghị, ọ ga-abụ na ị hụtụla ndị a kpọrọ asị. N’akụkọ ụwa, anyị na-anụkarị gbasara ndị kpọrọ ndị ọzọ asị n’ihi agbụrụ ha si, ma ọ bụ n’ihi na ha bụ ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị ma ọ bụkwanụ ndị mbịarambịa. Ọ bụ ya mere ndị ọchịchị n’obodo dị iche iche ji eti iwu na mmadụ mesie onye ọzọ ike maka na ọ kpọrọ ya asị, a ga-ata ya ezigbo ahụhụ.

Ndị a kpọrọ asị na-akpọkarịkwa ndị ọzọ asị. Ndị e mere ihe ọjọọ maka na a kpọrọ ha asị na-emegwarakarị ihe e mere ha. Ihe a na-emekwa ka ịkpọasị na-arị ibe ya elu.

O nwere ike ịbụ na e nwetụla onye kpọrọ gị asị maka obodo i si. Ma ọ bụkwanụ na mmadụ akwatụla gị emo, kparịa gị, ma ọ bụ yie gị egwu. E nwedịrị ihe ndị ọzọ ka njọ ịkpọasị na-akpata. Ọ na-emekarị ka obi fee ndị mmadụ azụ, ha ana-emesi ndị ọzọ ike, na-emebisị ihe ndị ọzọ nwe, na-eti ndị ọzọ ihe, na-edina ndị ọzọ n’ike, na-egbu ndị ọzọ, ma ọ bụdị gbukpọọ otu agbụrụ.

Ụlọ Nche a ga-eme ka anyị mata otú ịkpọasị ga-esi akwụsị. Ọ ga-azakwa ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere ọtụtụ ndị ji akpọ ibe ha asị?

  • Gịnị ka mmadụ ga-eme ka ọ kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị?

  • È nwere mgbe ịkpọasị na-agaghịzi adị n’ụwa a?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya