Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Ji Akpọ Ibe Ha Asị?
Gịnị mere ọtụtụ ndị ji kpọọ ibe ha asị n’ụwa taa? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ọ ga-adị mma ka anyị buru ụzọ mata ihe bụ ịkpọasị, ihe mere ndị mmadụ ji ebido ịkpọ ibe ha asị, na ihe mere ịkpọasị ji ju ebe niile.
Gịnị Bụ Ịkpọasị?
A sị na mmadụ kpọrọ onye ọzọ ma ọ bụ ndị ọzọ asị, ọ pụtara na ihe gbasara onye ahụ ma ọ bụ ihe gbasara ndị ahụ na-ewe ya ezigbo iwe, ọ naghịkwa achọ iji anya ahụ ha. Ọ bụghị obere iwe mmadụ na-ewesa onye ọzọ maka ihe o mere ya.
IHE MERE NDỊ MMADỤ JI EBIDO ỊKPỌ IBE HA ASỊ
E nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji ebido ịkpọ ibe ha asị. Ọ naghị abụkarị n’ihi ihe ndị ahụ mere, kama ọ na-abụkarị n’ihi otú ndị ọzọ si were ha. Ha nwere ike iwere ndị ha kpọrọ asị ka ndị ọjọọ, ndị a ga na-eze eze, ma ọ bụ ndị na-emekataghị gbanwee ndụ ọjọọ ha. Ha nwekwara ike iwere ha ka ndị na-enweghị ebe ha ruru ha, ndị nwere ike ịkpatara hanwa nsogbu, ma ọ bụkwanụ ndị ọbata osu. Ndị mmadụ nwekwara ike ịkpọ ndị ọzọ asị n’ihi na ndị ahụ megburu ha, taa ha ahụhụ, mesie ha ike, ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe ndị ọzọ.
IHE MERE ỊKPỌASỊ JI JU EBE NIILE
Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-akpọ ndị ha na-ahụtụbeghị mbụ asị. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike lewe ndị ọzọ anya ọjọọ maka na ndị ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya na-ele ndị ahụ anya ọjọọ. Tupu ị mara ihe na-emenụ, ndị ọzọ na-abịa soro kpọwa ndị ahụ asị.
Ọ bụrụ na anyị aghọta na ọ naghị esi ike ndị mmadụ esoro kpọwa ndị ọzọ asị, ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere ịkpọasị ji ju ebe niile. Ma, iji mata ihe ga-eme ka ịkpọasị kwụsị, ọ dị mkpa ka anyị mata kpọmkwem otú ịkpọasị si bido. Baịbụl kwuru otú ịkpọasị si malite.
IHE BAỊBỤL KWURU GBASARA OTÚ ỊKPỌASỊ SI BIDO
Ọ BỤGHỊ N’AKA ỤMỤ MMADỤ KA ỊKPỌASỊ SI BIDO. Ịkpọasị bidoro mgbe otu mmụọ ozi nọ n’eluigwe nupụụrụ Chineke isi. E mechara kpọwa ya Setan bụ́ Ekwensu. Ekwensu bụ “ogbu mmadụ mgbe ọ malitere” inupụrụ Chineke isi. Ebe ọ bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha,” ọ ka na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị ma na-emesi ibe ha ike. (Jọn 8:44; 1 Jọn 3:11, 12) Baịbụl kwuru na ọ bụ onye obi tara mmiri, onye ụfụ obi, na onye ezigbo iwe na-ewe.—Job 2:7; Mkpughe 12:9, 12, 17.
Ọ NAGHỊ ESIRI ỤMỤ MMADỤ IKE ỊMỤTA ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ. Adam, bụ́ nwoke mbụ biri n’ụwa, sooro Setan nupụrụ Chineke isi. N’ihi ya, mmadụ niile ketara mmehie na ezughị okè. (Ndị Rom 5:12) Ken, bụ́ ọkpara Adam, gburu Ebel nwanne ya maka na ọ kpọrọ ya asị. (1 Jọn 3:12) Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-egosi ndị ọzọ na ha hụrụ ha n’anya, na-emetakwara ibe ha ebere, ma mmehie anyị ketara n’aka Adam na-eme ka ọtụtụ ndị ọzọ na-achọ ọdịmma onwe ha naanị, na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ, onwe ha ana-ebukwa ha isi. Àgwà ndị a na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị.—2 Timoti 3:1-5.
ONYE NA-ANAGHỊ ACHỌ IJI ANYA AHỤ NDỊ ỌZỌ NA-AKPỌKARỊ NDỊ ỌZỌ ASỊ. Ihe na-eme ka ịkpọasị na-arị ibe ya elu n’ụwa taa bụ na ndị mmadụ anaghị ewere ya na imesi ndị ọzọ ike na emetereghị ha ebere bụ ihe ọjọọ. Ọ bụ maka na “ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, mere ịkpọasị, mkparị, ejighị anya ahụ ndị ọzọ, arụrụala, na imebisị ihe ndị mmadụ ji ju ebe niile.—1 Jọn 5:19.
Ma, ihe Baịbụl kwuru abụghị naanị otú ịkpọasị si malite, o kwukwara ihe ga-eme ka ọ kwụsị.