N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Oké Ịkpọasị?
Site N’aka Onye Nta Akụkọ Teta! Na Germany
“N’IHI gịnị”—okwu dị mkpirikpi, ma bụrụ nke na-achọ azịza. Dị ka ihe atụ, mgbe a hụrụ ebe e dekwasịrị ya n’ùkwù okooko osisi na n’ihe egwuregwu ụmụaka yiri anụ bear bụ́ ndị a tọgbọrọ n’èzí otu ụlọ akwụkwọ dị na Dunblane, Scotland, na March 1996. Nanị ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ, otu nwoke gbabatara ma gbagbuo ụmụaka 16 na onye nkụzi ha. O merụrụ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ wee gbagbuzie onwe ya. N’ụzọ doro anya, ịkpọasị jupụtara ya obi—maka onwe ya, maka ndị ọzọ, na maka ọha mmadụ n’ozuzu ha. Ndị nne na nna na ndị enyi na-eru újú tinyere ọtụtụ nde ndị mmadụ gburugburu ụwa jụrụ otu ajụjụ ahụ, ‘N’ihi gịnị? N’ihi gịnị ka ụmụaka na-enweghị ihe ha mere ji anwụ n’ụzọ dị otú a?’
Ma eleghị anya ị chọpụtawo na ụwa jupụtara n’ịkpọasị na-enweghị isi, nke a na-apụghị ịkọwa ihe kpatara ya. N’eziokwu, n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ị pụrụ ịbụworị onye e mesoro omume ịkpọasị n’onwe gị. Ikekwe gị onwe gị ajụwokwa, sị, ‘N’ihi gịnị’—ma eleghị anya ihe karịrị nanị otu ugboro.
Ụdị Ịkpọasị Dị Mma na nke Na-adịghị Mma
A na-akọwa “asị” na “ịkpọasị” dị ka “oké ibu iro na enweghị mmasị.” N’ezie, ọ bara uru inwe “oké ibu iro na enweghị mmasị” maka ihe ndị na-emerụ ahụ ma ọ bụ ndị pụrụ imebi mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọ bụrụ na mmadụ nile nwere ụdị ịkpọasị a, ụwa ga-abụ n’eziokwu ebe ka mma ibi. Otú ọ dị, ọ dị mwute ikwu na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-akpọkarị ihe ndị na-ekwesịghị ịkpọ asị asị n’ihi ihe ndị na-ezighị ezi.
Ịkpọasị na-ebibi ihe na-adabere n’ajọ mbunobi, amaghị nke a na-akọ, ma ọ bụ amaghị ihe bụ eziokwu, ọ bụkwa “egwu, iwe, ma ọ bụ echiche nke mmejọ” na-akpasukarị ya, dị ka otu nkọwa na-ekwu. N’enweghị ihe ndabere kwesịrị ekwesị, ịkpọasị a na-arụpụta ihe ọjọọ ma na-akpata ugboro ugboro ajụjụ bụ, ‘N’ihi gịnị?’
Anyị nile maara ndị njimara ma ọ bụ àgwà ha pụrụ ịkpasu anyị iwe mgbe ụfọdụ, ndị ọ na-esikwara anyị ike iso mekọọ ihe. Ma mkpasu iwe bụ otu ihe; ọchịchọ imerụ ndị mmadụ ahụ bụrịị ihe ọzọ. Ya mere, ọ pụrụ isiri anyị ike ịghọta otú mmadụ pụrụ isi buru mmetụta ịkpọasị n’obi maka ìgwè mmadụ dum, ọtụtụ mgbe ọbụna ndị ọ na-amaghị. Ha pụrụ ịjụ echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, nọrọ n’okpukpe dị iche, ma ọ bụ bụrụ ndị agbụrụ ọzọ, ma nke ahụ ọ̀ bụ ihe mere a ga-eji kpọọ ha asị?
Otú ọ dị, ịkpọasị dị otú ahụ dị adị! N’Africa, ịkpọasị dujere ebo Hutu na Tutsi igburịta onwe ha na Rwanda na 1994, na-akpali otu onye nta akụkọ ịjụ, sị: “Olee otú oké ịkpọasị si jupụta ná mba a dị nnọọ ntakịrị?” N’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ịkpọasị akpatawo ndị Arab na ndị Israel na-anụbiga ọkụ n’obi ókè ime mwakpo iyi ọha egwu. Na Europe, ịkpọasị dujere ná nkewasị nke ebe bụbu Yugoslavia. Dịkwa ka akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ si kwuo, na United States nanị, “ihe dị ka ìgwè 250 na-akwalite ịkpọasị” nọ na-agbasa echiche ịkpa ókè agbụrụ. N’ihi gịnị ka e ji nwee oké ịkpọasị? N’ihi gịnị?
Ịkpọasị gbamiri mkpọrọgwụ nke ukwuu nke na ọbụna mgbe e dozisịrị esemokwu ndị ọ kpalitere, ọ na-adịgide. Olee otú ọzọ anyị pụrụ isi kọwaa ihe mere o ji esi ike ịnọgide na-enwe udo na nkwụsị ibu agha ná mba ndị agha na iyi ọha egwu tisasịworo? Olee otú ọzọ anyị pụrụ isi kọwaa ihe mere mgbe nkwekọrịta udo ahụ a bịanyere aka na ya ná ngwụsị nke 1995 na Paris kwusịrị ka e jikọtaghachi obodo ukwu bụ́ Sarajevo n’okpuru Njikọ Mba Bosnia na Herzegovina-Croat? Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Serbia bi n’ebe ahụ malitere ịgbapụ n’obodo ukwu ahụ na n’ógbè ya ndị dịpụrụ adịpụ n’ihi ụjọ mmegwara. N’ịkọ na ndị mmadụ na-ezukọrọ ngwongwo ndị mmadụ ma na-agba ụlọ ndị ha na-ahapụ ọkụ, Time kwubiri, sị: “E jikọtaghachiwo Sarajevo; ma e jikọtaghachibeghị ndị ya.”
Udo n’etiti ndị kpọrọ ibe ha asị bụ n’ọnọdụ kasị mma udo adịgboroja, nke na-abaghị uru dị ka ego adịgboroja. N’enweghị ezigbo ihe ọ bụla iji kwadoo ya, ọ pụrụ ịdakpọ n’okpuru nrụgide kasị nta. Ma e nwere oké ịkpọasị n’ụwa na ịhụnanya dị ntakịrị nke ukwuu. N’ihi gịnị?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Ịkpọasị na-ebibi ihe na-adabere n’ajọ mbunobi, amaghị nke a na-akọ, ma ọ bụ amaghị ihe bụ eziokwu