Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/15 p. 3-4
  • Ọ̀ Dị Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkụ Mkpụrụ nke Ịkpọasị
  • Ihe Ndị Na-esi n’Ịkpọasị Apụta
  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Ji Akpọ Ibe Ha Asị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Oké Ịkpọasị?
    Teta!—1997
  • Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị Kpamkpam
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/15 p. 3-4

Ọ̀ Dị Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị?

Ọ BỤRỤ na i kiritụla ọbụna akụkọ ụwa ole na ole na telivishọn, ịkpọasị abụghị ihe ọhụrụ nye gị. Ịkpọasị bụ ihe bụ isi na-akpata mgbukpọsị ndị mmadụ nke fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na kwa ụbọchị o yiri ka ha na-ahapụ akara ha jupụtara n’ọbara n’ụwa nke a. Site na Belfast ruo Bosnia, site Jerusalem ruo Johannesburg, a na-egbu ndị na-ekiri ihe na-emenụ bụ́ ndị ihe na-adịghị agaziri.

Ndị ahụ e gburu na-abụkarị ndị ndị ahụ wakporo ha na-amaghị ama. Nanị “mpụ” ha mere bụ na ma eleghị anya ha nọ “n’akụkụ nke ọzọ.” N’omume mgbanwerịta ihe nke na-atụ egwu, ụdị ọnwụ ndị ahụ pụrụ ịbụ ịbọ ọ́bọ̀ maka ụfọdụ omume ọjọọ e mere na mbụ ma ọ bụ ụdị ihe dị ka “mkpochapụ agbụrụ.” Ntiwapụ ọ bụla nke ime ihe ike na-eje ozi iji fụnwuo ọkụ nke ịkpọasị n’etiti òtù ndị a na-emegiderịta ibe ha.

Ihe ụjọ ndị a nke ịkpọasị na-emeghachi mgbe mgbe yiri ka ọ na-arị elu. Esemokwu n’etiti òtù ndị si n’otu ọbara na-apụta n’etiti agbụrụ, ebo ma ọ bụ òtù okpukpe dị iche iche. À pụrụ ikpochapụ ịkpọasị mgbe ọ bụla? Iji zaa nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe ndị na-akpata ịkpọasị, ebe ọ bụ na a mụghị anyị ịkpọ mmadụ asị.

Ịkụ Mkpụrụ nke Ịkpọasị

Zlata Filipovic, nwa agbọghọ Bosnia sitere Sarajevo, amụtabeghị otú e si akpọ mmadụ asị. N’akwụkwọ ọ na-eji edetu ihe, o dere n’ụzọ pụtara ìhè banyere ime ihe ike nke agbụrụ, sị: “M nọgidere na-ajụ N’ihi gịnị? Maka gịnị? Ònye ka ụta dịịrị? M na-ajụ ma azịza adịghị. . . . N’ime ndị enyi m nwanyị, n’ime ndị enyi anyị, n’ezinụlọ anyị, e nwere ndị Serbia na ndị Croatia na ndị Alakụba. . . . Anyị na ndị ọma na-akpakọrịta, ọ bụghị ndị ọjọọ. N’ime ndị ọma ahụ e nwekwara ndị Serbia na ndị Croatia na ndị Alakụba, dịkwa ka e nwere n’ime ndị ọjọọ.”

N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị toworo eto na-eche ihe dị iche. Ha kweere na ha nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji akpọ mmadụ asị. N’ihi gịnị?

Ikpe na-ezighị ezi. Eleghị anya ihe bụ isi na-akpata ịkpọasị bụ ikpe na-ezighị ezi na mmegbu. Dị ka Bible kwuru, “mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.” (Eklisiastis 7:7) Mgbe e mejọrọ ma ọ bụ mekpọọ ndị mmadụ ọnụ, ọ dịịrị ha mfe ịzụlite ịkpọasị n’ebe ndị mmegbu ahụ nọ. Ọ bụkwa ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe ezi uche na-adịghị na ya, ma ọ bụ “omume isi mgbaka,” ịkpọasị ahụ na-abụkarị megide ìgwè nile.

Ọ bụ ezie na ikpe na-ezighị ezi, nke bụ eziokwu ma ọ bụ nke e chere n’echiche, pụrụ ịbụ ihe bụ isi na-akpata ịkpọasị, ọ bụghi nanị ya. Ihe ọzọ bụ inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ.

Inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ. Inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ na-esitekarị n’amaghị ihe banyere otu agbụrụ ma ọ bụ ìgwè nke mba. N’ihi ịnụ ihe site n’ọnụ ndị ọzọ, ibu iro omenala, ma ọ bụ ahụmahụ ọjọọ e nwere n’ebe otu ma ọ bụ mmadụ abụọ nọ, ụfọdụ nwere ike iche na àgwà nke agbụrụ ma ọ bụ mba n’ozuzu ha jọrọ njọ. Ozugbo echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ gbaworo mkpọrọgwụ, ọ pụrụ ikpuchi ndị mmadụ anya n’ebe eziokwu dị. “Anyị na-akpọ ụfọdụ ndị asị n’ihi na anyị amaghị ha; anyị agaghịkwa amata ha n’ihi na anyị kpọrọ ha asị,” ka onye England na-ede ihe bụ́ Charles Caleb Colton kwuru.

N’aka nke ọzọ, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme pụrụ ịma ụma kwalite echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ n’ihi inweta uru ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ịhụ mba n’anya. Hitler bụ ihe atụ kasị ukwuu na nke a. Georg, onye bụbu onye òtù nke òtù Ndị Ntorobịa Hitler, na-asị: “Mkpọsa aghụghọ nke ndị Nazi kụziiri anyị nke mbụ ịkpọ ndị Juu asị, e mechaa ndị Russia, mechazie ‘ndị iro nile nke Reich.’ Dị ka onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, ekwenyere m ihe a gwara m. Mgbe oge na-aga, m chọpụtara na a ghọgbuola m.” Dị ka na Nazi Germany na n’ebe ndị ọzọ, inwe echiche na-ezighị ezi banyere agbụrụ ma ọ bụ ebo abụrụwo nke a sịrị na ọ dịghị njọ site n’ịkpali ịhụ mba n’anya, isi iyi ọzọ nke ịkpọasị.

Ịhụ mba n’anya, ịkpa ókè agbụrụ, na ịkpọasị agbụrụ. N’akwụkwọ ya bụ́ The Cultivation of Hatred, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Peter Gay na-akọwa ihe merenụ mgbe Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ: “N’agha nke nnọgidesi ike n’ihe dị iche iche ịhụ mba n’anya dị ike karịa ndị ọzọ nile. Ịhụ mba onwe onye n’anya na ịkpọ ndị iro ya asị ghọrọ ihe kasị ike e ji akwado mwakpo nke ogologo narị afọ iri na itoolu mepụtara.” Echiche ịhụ mba n’anya nke ndị Germany mere ka abụ ndị agha a maara dị ka “Abụ nke Ịkpọasị” bụrụ nke na-ewu ewu. Gay na-akọwa na ndị na-akpali ịkpọasị na Britain na France chepụtara akụkọ dị iche iche banyere ndị agha Germany ịdị na-edina ndị inyom n’ike, na-egbukwa ụmụ ọhụrụ. Siegfried Sassoon, onye agha bụ́ onye England, na-akọwa isi ihe dị na mkpọsa aghụghọ agha nke Britain: “O yiri ka e mewo mmadụ igbu ndị Germany.”

Dị ka ịhụ mba n’anya, ibuli otu ebo ma ọ bụ agbụrụ elu gabiga ókè pụrụ ịkpasu ịkpọasị nke ebo ma ọ bụ agbụrụ ndị ọzọ. Ịkpa ókè agbụrụ anọgidewo na-akpake ime ihe ike n’ọtụtụ mba Africa ebe ịkpọasị agbụrụ ka nọkwa na-eti Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe na North America ihe otiti. Ihe ọzọkwa na-akpata nkewa nke pụrụ ikwekọ n’ịhụ mba n’anya bụ okpukpe.

Okpukpe. Ọtụtụ n’ime agha ndị kasị sie ike nchịkwa n’ụwa nwere mmetụta okpukpe siri ike. Na Northern Ireland, n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ, na n’ebe ndị ọzọ, a na-akpọ ndị mmadụ asị n’ihi okpukpe ha na-ekpe. Ihe karịrị narị afọ abụọ gara aga, onye England na-ede akwụkwọ bụ́ Jonathan Swift kwuru, sị: “Anyị nwere nnọọ okpukpe zuru ezu iji mee ka anyị na-akpọ asị, ma ọ bụghị nke zuru ezu iji mee ka anyị na-ahụ ibe anyi n’anya.”

Na 1933, Hitler gwara bishọp nke Osnabrück, sị: ‘Banyere ndị Juu, m ka nọ na-aga n’ihu n’otu ụkpụrụ ahụ nke Chọọchị Katọlik nakwewooro kemgbe 1,500 afọ.’ Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ndú chọọchị Germany akatọghị omume igbu ndị mmadụ n’ihi ịkpọasị ya nile ma ọlị. Paul Johnson, n’akwụkwọ ya bụ́ A History of Christianity, rịbara ama na “Chọọchị ahụ chụpụrụ ndị Katọlik kwuru n’akwụkwọ ha deturu ọchịchọ ha na ọ ga-amasị ha ịbụ ndị a kpọrọ ozu ha ọkụ, . . . ma o gbochighị ha ịrụ ọrụ n’ogige ịta ahụhụ ma ọ bụ n’ogige ọnwụ dị iche iche.”

Ụfọdụ ndị ndú okpukpe emeela ihe karịrị ịnabata ịkpọasị—ha edowo ya nsọ. Na 1936, mgbe Agha Obodo Spain tiwapụrụ, Pope Pius nke Iri na Otu katọrọ ‘ajọ ịkpọasị a kpọrọ Chineke’ nke ndị Republican—ọ bụ ezie na e nwere ndị ụkọchukwu Katọlik nọ n’akụkụ nke Republican. N’otu aka ahụ, Cardinal Gomá, bishọp ukwu nke Spain n’oge agha obodo ahụ, zọọrọ na ‘Ime ka udo dịrị agaghị ekwe omume n’akwarịtaghị mgbọ.’

Ịkpọasị okpukpe adịghị egosi ihe àmà nke iselata aka. Na 1992 magazin bụ́ Human Rights Without Frontiers katọrọ ụzọ ndị isi nke Chọọchị Greek Orthodox si na-akpali ịkpọasị megide Ndịàmà Jehova. N’ime ọtụtụ ihe atụ, o hotara ihe banyere onye ụkọchukwu Greek Orthodox gbara Ndịàmà abụọ dị afọ 14 akwụkwọ n’ụlọikpe. Gịnị ka o boro ha ebubo ya? O boro ha ebubo ‘ịgbalị ime ya ka ọ gbanwee okpukpe ya.’

Ihe Ndị Na-esi n’Ịkpọasị Apụta

N’ụwa nile, a na-akụ mkpụrụ nke ịkpọasị ma na-akwọsa ya mmiri site n’ikpe na-ezighị ezi, inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ, ịhụ mba n’anya, na okpukpe. Mkpụrụ ya nke a na-agaghị ezere ezere bụ iwe, mwakpo, agha, na mbibi. Okwu Bible na 1 Jọn 3:15 na-enyere anyị aka ịhụ otú nke a si bụrụ oké ihe: “Onye ọ bụla nke na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ.” N’ezie, ebe ịkpọasị na-eme nke ọma, udo—ọ bụrụdị na ọ dị adị—akwụsighị ike.

Elie Wiesel, onye ritere Onyinye Nobel nakwa onye lanarịrị Oké Mgbukpọ, dere, sị: “Ọrụ nke onye ahụ lanarịrịnụ bụ ịgba akaebe banyere ihe merenụ . . . Ị ghaghị ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị na ihe ndị a pụrụ ime, na a pụrụ ịwụpụta ihe ọjọọ. Ịkpọasị agbụrụ, ime ihe ike, ikpere arụsị—ha ka na-eto nke ọma.” Akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke 20 na-enye ihe nnwapụta na ịkpọasị abụghị ihe ga-eji nwayọọ nwayọọ kwụsị.

Ò nwere mgbe a ga-efopụ ịkpọasị n’obi ndị mmadụ? Ịkpọasị ọ̀ na-ebibi ihe mgbe mgbe, ka è nwere akụkụ ya dị mma? Ka anyị leenụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya