E nwere ike iji anụmanụ kwụọ ụgwọ isi nwaanyị
Ị̀ Maara?
Gịnị mere ndị Izrel oge ochie ji akwụ ụgwọ isi nwaanyị?
N’OGE ochie, a na-akwụ ezinụlọ nwaanyị a na-alụ ọhụrụ ụgwọ isi nwaanyị ma a chọwa ịlụ ya. E nwere ike iji anụmanụ, ego, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ bara uru kwụọ ụgwọ isi nwaanyị. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-arụ ọrụ iji kwụọ ụgwọ isi nwaanyị, dị ka Jekọb mere mgbe ọ chọrọ ịlụ Rechel. O kwetara ịrụrụ nna Rechel ọrụ afọ asaa iji kwụọ ụgwọ isi ya. (Jen. 29:17, 18, 20) Olee ihe mere e ji akwụ ụgwọ isi nwaanyị?
Otu ọkà mmụta Baịbụl aha ya bụ Carol Meyers sịrị: “E ji ụgwọ isi nwaanyị eti nne na nna nwaanyị a na-alụ ọhụrụ aka n’obi maka ọrụ nwa ha gaara arụrụ ha n’ubi. Ọ dị ezigbo mkpa ebe ọ bụ na ndị Izrel bụ ndị ọrụ ubi. Ụgwọ isi nwaanyị nwekwara ike ime ka ezinụlọ abụọ ahụ bụ́zi ndị ọgọ na-adịkwu ná mma, meekwa ka ha nwee ike ịna-enyere ibe ha aka mgbe ihe siri ike. Ụgwọ isi nwaanyị ahụ na-egosikwa na ọ bụghịzi nna nwaanyị ahụ ka ọ dịịrị ịna-echebe ya na ịna-egboro ya mkpa ya, kama ọ bụzi di ya.
Ịkwụ ụgwọ isi nwaanyị apụtaghị na nwaanyị bụzi ngwá ahịa e nwere ike ịzụ azụ ma ọ bụ ire ere. Otu akwụkwọ aha ya bụ Ancient Israel—Its Life and Institutions kwuru, sị: “Ụgwọ isi nwaanyị ahụ a na-achọ ka nwoke kwụọ ezinụlọ nwaanyị ọ na-alụ na-eme ka ọ dị ka ọ̀ bụ orire ka e rere nwaanyị ahụ. Ma, ọ dị ka à na-ewere ya ka ihe e ji tie ezinụlọ nwaanyị ahụ aka n’obi kama ịbụ ihe e rere ya.”
Taa, a ka na-akwụ ụgwọ isi nwaanyị n’ọtụtụ obodo. Ọ bụrụ na nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ekwuwe ihe a ga-enye ha maka ụgwọ isi nwa ha, ha kwesịrị ime ‘ka mmadụ niile mara na ha na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.’ Ha anaghị ana ihe karịrị akarị. (Fil. 4:5; 1 Kọr. 10:32, 33) Ime otú ahụ ga-egosi na ha abụghị “ndị hụrụ ego n’anya” ma ọ bụ ndị anya ukwu. (2 Tim. 3:2) Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na nne na nna bụ́ Ndị Kraịst anaghị ana ụgwọ isi karịrị akarị, onye chọrọ ịlụ nwa ha agaghị eyigharị mgbe ọ ga-alụ ya ruo mgbe o nwetazuru ụgwọ isi ya, ma ọ bụkwanụ kwụsị ịsụ ụzọ iji nwekwuo ohere ọ ga-eji rụta ụgwọ isi nwaanyị karịrị akarị.
N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ọ bụ ndị ọchịchị na-ekwu ego ole ụgwọ isi nwaanyị ga-abụ. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eme ihe iwu obodo kwuru. N’ihi gịnị? N’ihi na Okwu Chineke gwara Ndị Kraịst ka ha “na-erubere ndị ọchịchị isi,” na-erubekwa isi n’iwu ọ bụla na-emegideghị iwu Chineke.—Rom 13:1; Ọrụ 5:29.