IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Jikere Ịna-amụta Ihe Ọhụrụ ma Ị Na-amụ Ihe
Anyị chọwa ịmụ ihe, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Gịnị ka m bu n’obi ịmụta?’ Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ikwe ka ihe anyị bu n’obi ịmụta mee ka anyị ghara ịmụta ihe Jehova na-akụziri anyị. Olee otú anyị ga-esi dị njikere ịmụta ihe ma anyị na-amụ ihe?
Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. Rịọ ya ka o nyere gị aka ịghọta ihe ọ chọrọ ka ị mụta ugbu a. (Jems 1:5) Gbalịa ka ị mụta ihe ọhụrụ, ọ bụghị ihe ndị ị mabu.—Ilu 3:5, 6.
Kwe ka Baịbụl na-akpa ike ná ndụ gị. “Okwu Chineke dị ndụ.” (Hib. 4:12) Mgbe ọ bụla anyị gụrụ Baịbụl, o nwere ike ịkụziri anyị ihe ọhụrụ ga-enyere anyị aka ná ndụ anyị. Ọ ga-emere anyị otú ahụ naanị ma ọ bụrụ na anyị ekweta na e nwere ihe Chineke chọrọ ịkụziri anyị.
Jiri ihe niile Chineke ji akụziri anyị ihe kpọrọ ihe. Ihe ndị ọ na-akụziri anyị dị ka “nnukwu oriri nke . . . na-edozi ahụ́.” (Aịza. 25:6) Ahapụla ịgụ isiokwu ndị i chere na ha agaghị atọ gị ụtọ. Ị ga-esi otú ahụ kwe ka Chineke mee ka ị bụrụkwuo ezigbo mmadụ, ịmụ ihe ana-atọkwa gị ụtọ.