Mbọ Òtù Dị Iche Iche Na-agba Ọ̀ Ga-eme Ka Udo Dị n’Ụwa?
Mba dị iche iche ịlụso ibe ha agha na ịkwarịta mgbọ bụzi ihe na-eme kwa ụbọchị taa. N’ihi ya, Òtù Mba Ụwa na òtù ndị ọzọ dị iche iche na-agba mbọ ime ka mba dị iche iche dịrị n’udo. Otu ụzọ ha si eme ya bụ ime ka ndị na-anọchianya ha nọrọ ebe ndị a na-alụ agha. Ha bu n’obi ime ka ihe katụ mma n’ebe ndị ahụ a na-alụ agha. Onyeisi Òtù Mba Ụwa bụ́ António Guterres kwuru, sị: “Ihe kacha mkpa anyị merela iji mee ka udo dị n’ụwa bụ iziga ndị òtù anyị ọrụ ha bụ ime udo n’ebe dị iche iche.”
Kemgbe ọtụtụ afọ, mbọ òtù dị iche iche na-agba ime ka mba ndị na-alụ agha dịrị n’udo abaala ụfọdụ uru. Dị ka ihe atụ, ha echebela ndị nkịtị, kpọghachi ndị gbara ọsọ ndụ n’obodo ha, bute nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa, nyekwa aka rụzie ihe ndị e mebiri mgbe a na-alụ agha. Ma, e nwere nnukwu nsogbu ndị na-egbochi ndị ahụ na-eme udo ime ihe niile ha bu n’obi. È nwere ihe ga-emecha mee ka udo dịrị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a?
Nsogbu ndị na-eme ka ime udo sie ike na ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka ha kwụsị
Nsogbu: ndị kwe na ndị ekweghị. Ọ naghị adị mfe ime ka, ma ndị amị ma ndị nkịtị, ndị si mba dị iche iche kwekọrịta n’ihe a ga-eme ka udo dị. Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka ndị okwu ahụ gbasara ghara inwe otu olu bụ n’ihi na ha aghọtaghị ibe ha nakwa n’ihi na ihe bụ́ mkpa ha dị iche iche.
Ihe Baịbụl kwuru ga-akwụsị nsogbu a: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze . . . malite ịchị. . . . Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze ndị a niile [ya bụ, ọchịchị ụmụ mmadụ], mee ka ha ghara ịdịkwa, ma naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-akwụsị agha niile ma mee ka udo dị ebe niile n’ụwa. (Abụ Ọma 46:8, 9) Ọ ga-eme ka otu ọchịchị, ya bụ, Alaeze Chineke, nọchie ọchịchị niile dị n’ụwa. Ebe ọ bụzi otu ọchịchị pụrụ iche ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa a nsogbu na-agaghịzi adị na ya, ọ gaghịzi aba uru inwe òtù dị iche iche ndị na-eme ka mba dị iche iche dịrị n’udo.
Nsogbu: enweghị ego na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ihe ọzọ na-egbochi ndị na-eme udo ime ihe ndị ha bu n’obi bụ enweghị ndị ọrụ, ego, na ihe ndị ọzọ ga-ezuru ha ịrụ ọrụ ha. Ebe ndị a na-eme udo na-aru ọrụ ha bụkwa n’ebe ọgba aghara dị nakwa ebe ihe nwere ike imerụ ha ahụ́.
Ihe Baịbụl kwuru ga-akwụsị nsogbu a: ‘Chineke nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nyere Jizọs oche n’aka nri ya n’eluigwe, n’ebe dị elu karịa ọchịchị niile na ndị niile nwere ikike na ndị niile dị ike.’—Ndị Efesọs 1:17, 20, 21.
Jehova,a bụ́ Chineke pụrụ ime ihe niile, enyela Jizọs, bụ́ onye ọ họọrọ ka ọ bụrụ Eze n’Alaeze Chineke, ihe niile ọ ga-eji chịa ọchịchị ya. (Daniel 7:13, 14b) Chineke enyela Jizos nnukwu ike, amamihe, na nghọta karịrị nke onye ọchịchị ma ọ bụ òtù ọ bụla ọzọ. (Aịzaya 11:2) E nwekwara ìgwè ndị mmụọ ozi dị ike ndị Jizọs nwere ike iji rụọ ihe ọ bụla ọ chọrọ. (Mkpughe 19:14) E nweghị nsogbu karịrị ya ma ọ bụ nke ga-esiri ya ike ịkwụsị.
Ihe Jizọs ga-eji ike na ihe ndị ọzọ niile Chineke nyere ya mee abụghị naanị ime ka agha kwụsị. Kama, ọ ga-eme ka ebe niile dị jụụ, mee ka obi ruo onye ọ bụla ala, meekwa ka udo dị ebe niile n’Alaeze Chineke.—Aịzaya 32:17, 18.
Nsogbu: ihe iwu kwuru ka a ghara ime. Mgbe ụfọdụ, ndị na-eme udo anaghị eme ihe ha chọrọ ime n’ihi na ihe iwu kwuru ha nwere ike ime ma ọ bụ ihe a tụrụ anya n’aka ha edochaghị ha anya. Ihe ọzọ bụkwa na e nwere ihe ndị iwu kwuru na ha ekwesịghị ime. Ụdị ihe a na-eme ka ha ghara ichebeli ndị ọzọ ma ọ bụ imecha ihe niile ha bu n’obi.
Ihe Baịbụl kwuru ga-akwụsị nsogbu a: “E nyela [Jizọs] ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.”—Matiu 28:18.
Chineke agwala Jizọs ihe doro anya ọ chọrọ ka o mee, ya bụ, ka o mee ka udo dị n’ụwa, o nyekwala ya ike niile ọ ga-eji eme ya. (Jọn 5:22) Jizọs emekataghị megbuo onye ọ bụla ma ọ bụ rụrụọ aka. (Aịzaya 11:3-5) Ọ dabara adaba na Baịbụl kpọrọ Jizọs “Onyeisi Udo,” onye Alaeze ya ga-esi ike n’ihi na “ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume.”—Aịzaya 9:6, 7.
Alaeze Chineke ga-eme ka ezigbo udo dịrị
Òtù dị iche iche ndị na-eme ka mba dị iche iche dịrị n’udo nwere ike ime ka ihe dịtụ mma, ha nwedịrị ike ime ka ndị na-alụ agha kwụsị ịlụ agha. Ma, ha agaghị akwụsịli ihe na-akpata agha, ya bụ, asị ndị mmadụ kpọrọ ibe ha.
Dennis Jett, onye bụbu onye na-anọchite anya Amerịka, kwuru, sị: “E nweghị otú a ga-esi mee ka udo dị n’ebe ndị mmadụ na-amabughị ihe bụ́ udo.”
Ma, Alaeze Chineke ga-eme ka ezigbo udo dịrị n’ihi na ọ ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị. Dị ka ihe atụ, ị manụ na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o si n’ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-eme udo ma na-egosi ndị ọzọ na ha hụrụ ha n’anya:
Jizọs kwukwara na ihe a ga-eji amata ndị Alaeze Chineke ga-achị bụ na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya. Baịbụl mere ka o doo anya na a gaghị ekwe ka ndị kpọrọ ndị ọzọ asị biri n’Alaeze Chineke:
Jehova Chineke, onye kere ụmụ mmadụ, ma ihe kacha mma, bụkwanụ naanị ihe ga-eme ka udo dịrị n’ụwa. Alaeze ya ga-eme ihe ụmụ mmadụ, ma òtù dị iche iche ndị na-eme ka mba dị iche iche dịrị n’udo, na-enweghị ike ime.
a Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”
b Ọ bụ Jizọs Kraịst ka a kpọrọ “nwa nke mmadụ” na Daniel 7:13, 14.—Matiu 25:31; 26:63, 64.