Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 62
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Amụ Asụsụ Ọzọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Amụ Asụsụ Ọzọ?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị mere ndị mmadụ ji amụ asụsụ ọzọ?
  • Gịnị mere o ji esi ike?
  • Olee uru ọ bara?
  • Ije Ozi n’Ọgbakọ Na-asụ Asụsụ Mba Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • ‘Asụsụ ahụ Dị Ọcha’ Ọ̀ Na-aga Gị Were Were n’Ọnụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ikwusara Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Asụsụ Dị Ọcha Nye Mba Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 62
Ebe mmadụ na-amụ asụsụ ọzọ

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Amụ Asụsụ Ọzọ?

Ọ naghị adị mfe ịmụ asụsụ ọzọ. Ịgba mbọ na-amụ ya ga-egosi ma ị̀ na-adị uchu na-adịkwa umeala n’obi. Ma ọ̀ bara uru ịmụ asụsụ ọzọ? Ọtụtụ ndị na-eto eto kwetara na ịmụ asụsụ ọzọ bara uru. Isiokwu a ga-akọwa ihe mere ha ji amụ asụsụ ọzọ.

  • Gịnị mere ndị mmadụ ji amụ asụsụ ọzọ?

  • Gịnị mere o ji esi ike?

  • Olee uru ọ bara?

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị mere ndị mmadụ ji amụ asụsụ ọzọ?

Ọtụtụ ndị na-amụ asụsụ ọzọ n’ihi na ụlọ akwụkwọ ha chọrọ ka nwa akwụkwọ ọ bụla mee ya. Ndị ọzọ na-amụkwa ya n’ihi na e nwere ihe ha chọrọ iji ya eme. Dị ka ihe atụ:

  • Otu nwa agbọghọ bi n’Ọstrelia aha ya bụ Anna chọrọ ịmụta asụsụ ndị Latvia, bụ́ asụsụ ndị obodo mama ya. Ọ sịrị: “Ndị ezinụlọ anyị na-akwado ịga Latvia, m chọrọ ka mụ na ụmụnne m nwee ike ịna-akparịta ma anyị ruo.”

  • Otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Gina, bụ́ onye Amerịka, mụtara Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka, kwagazie Beliiz ka o nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ọ sịrị: “Naanị ndị onye ogbi ma bụ ndị na-asụ asụsụ ya. Ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ ma m gwa ha na ihe mere m ji mụọ asụsụ ndị ogbi bụ ka m nwee ike ịkụziri ha Baịbụl n’asụsụ ha.”

Ị̀ Maara? Baịbụl buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ná “mba niile na ebo niile na asụsụ niile.” (Mkpughe 14:6) Iji mezuo amụma a, ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-amụ asụsụ ọzọ ka ha nwee ike ikwusakwu ozi ọma n’obodo ha ma ọ bụ n’obodo ọzọ.

Gịnị mere o ji esi ike?

Ọ naghị adị mfe ịmụta asụsụ ọzọ. Otu nwa agbọgho na-eto eto aha ya bụ Corrina kwuru, sị: “Eche m na ihe dị n’ịmụ asụsụ ọhụrụ bụ naanị ịmụta ihe ndị ahụ na-akpọ ihe ọ bụla, ma m chọpụtara na m kwesịkwara ịmụta omenala ha na otú ha si eche echiche. Ịmụ asụsụ ọzọ na-ewe oge.”

Mmadụ kwesịrị ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịmụta asụsụ ọzọ. Otu nwa okorobịa mụrụ asụsụ Spanish, aha ya bụ James kwuru, sị: “Ị ga-agba mbọ mụta ịchị onwe gị ọchị n’ihi na a ga-enwe ọtụtụ okwu ị na-agaghị akpọta. Ma, o so n’ihe dị n’ịmụ asụsụ ọzọ.”

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ọ bụrụ na ị ga-edili ihe ndị ị na-anaghị emeta na ọchị a ga-achị gị, ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị nwere ike ịdapụta ma ị kpọjọọ okwu, ọ ga-eme ka ị mụta asụsụ ọzọ nke ọma.

Ihe ndị ga-enyere gị aka: Ike agwụla gị ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-amụta ya ọsọ ọsọ karịa gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”​—Ndị Galeshia 6:4.

Olee uru ọ bara?

Uru dị n’ịmụ asụsụ ọzọ dị ọtụtụ. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Olivia kwuru, sị: “Ị mụta asụsụ ọzọ, gị na ndị si ebe ahụ ị mụrụ asụsụ ha ga-abụ enyi.”

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Mary chọpụtara na ịmụ asụsụ ọzọ na-eme ka ọ dị ya ka è nwere ihe ọ dị mma ya. Ọ sịrị: “Ọ nabughị adị m ka è nwere ihe m dị mma ya, ma ugbu a m na-amụ asụsụ ọzọ, obi na adị m ụtọ mgbe ọ bụla m mụtara okwu ọhụrụ n’asụsụ ahụ.”

Nwa agbọghọ ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite, aha ya bụ Gina, chọpụtara na iji asụsụ ndị ogbi akụziri ndị mmadụ Baịbụl na-eme ka ọ na-enwekwu obi ụtọ n’ozi ya. Ọ sịrị: “Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ ịhụ otú obi na-adị ndị m na-amụrụ ihe ma m jiri asụsụ ha na-amụrụ ha ihe.”

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ịmụta asụsụ ọzọ nwere ike inyere gị aka imeta ndị enyi ọhụrụ, mee ka ị mata na e nwere ihe ị dị mma ya, meekwa ka ozi gị na-atọkwu gị ụtọ. Ịmụta asụsụ ọzọ bụ otu ụzọ dị ezigbo mkpa e si ezi “ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” ozi ọma.​—Mkpughe 7:9.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Monica

“Mmadụ iche na ya agaghị amụtali asụsụ ọhụrụ ọ na-amụ dị ka taya moto dara afọ. Ma ị gbanweghị ya, o nweghị ebe i ji azụ aga. Ọ ka mma ka ị ghara ịna-eche na ị gaghị amụtali asụsụ ahụ, a sịgodi na ọ na-esiri gị ike.”​—Monica

Ethan

“Ịmụ asụsụ ọzọ dị ka ịchọ akụ̀ dị n’ime ala. I nwere ike igwu ya ruo ọtụtụ awa, ma o nweghị ihe ị ga-egwupụta. Ma ka ị na-egwu ya na-aga, ị ga na-erukwu nso n’ebe akụ̀ ahụ dị. Ị nọgide na-agba mbọ ka ị mụta asụsụ ọzọ, ị ga-amụta ya.”​—Ethan.

Jessica

“Uru kachanụ ịmụ asụsụ ọzọ ga-abara gị bụ na gị na ndị nwe asụsụ ahụ ga-ejizi ya na-akparịta ụka. Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-ahụ na oge niile na mgbalị niile i tinyere na-amụ asụsụ ahụ efughị ọhịa.”​—Jessica

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya