Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 155
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Inye Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Inye Ihe?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ?
  • Olee ụdị inye ihe na-anaghị amasị Chineke?
  • “Chineke Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ì Nwere Mmụọ nke Inye Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jehova Na-ahụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Na-enye Ihe Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 155
Ebe otu nwoke ji onyinye e kechiri ekechi

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Inye Ihe?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru na ọ dị mma inye ndị ọzọ ihe, nakwa na onye na-enye ihe kwesịrị iji obi ọcha ya na-enye ya. O kwukwara na iji obi ọcha nye ihe na-abara ma onye e nyere ihe ahụ uru ma onye nyere ya ihe ahụ. (Ilu 11:25; Luk 6:​38) Jizọs sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”​​—⁠Ọrụ Ndịozi 20:⁠35.

  • Olee ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ?

  • Olee ụdị inye ihe na-anaghị amasị Chineke?

  • Amaokwu Baịbụl ndị kwuru maka inye ihe

Olee ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ?

Ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ bụ nke mmadụ si n’obi ya nye. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”​​—⁠2 Ndị Kọrịnt 9:⁠7.

Mmadụ isi n’obi ya nye ndị ọzọ ihe so ‘n’ụdị ofufe’ Chineke na-anabata. (Jems 1:​27) Onye na-eji obi ya enyere ndị ọzọ aka so Chineke na-arụ ọrụ, n’ihi na Chineke na-ele onye na-emesapụ aka anya ka onye gbazinyere ya ihe. (Ilu 19:17) Baịbụl kwuru na Chineke n’onwe ya ga-akwụghachi onye ahụ ụgwọ ihe o mere.​​—⁠Luk 14:​12-​14.

Olee ụdị inye ihe na-anaghị amasị Chineke?

Ọ bụrụ na o nwere ihe mmadụ bu n’obi na-enye ya. Ihe ndị dị ka:

  • Ka ndị mmadụ too ya.​​—⁠Matiu 6:⁠2.

  • Iji ya nata ihe ọzọ.​​—⁠Luk 14:​12-14.

  • Iji ya zụtara onwe ya nzọpụta.​​—⁠Abụ Ọma 49:​6, 7.

Ọ bụrụ na e ji ya na-akwado ihe Chineke kpọrọ asị ma ọ bụ àgwà Chineke kpọrọ asị. Dị ka ihe atụ, ọ dị njọ inye mmadụ ego ka o jiri ya gbaa chaa chaa ma ọ bụ ka o jiri ya ṅụọ ọgwụ ike ma ọ bụ ṅụbiga mmanya ókè. (1 Ndị Kọrịnt 6:​9, 10; 2 Ndị Kọrịnt 7:⁠1) Otú ahụ ka ọ dịkwa iwere ego nye onye ahụ́ dị mma na-achọghị ịrụ ọrụ, ebe ọ bụ yanwa jụrụ ịrụ ọrụ ka o nwee ike ịna-akpata ego.​​—⁠2 Ndị Tesalonaịka 3:​10.

Ọ bụrụ na inye ihe ga-egbochi onye ahụ ịrụ ọrụ Chineke nyere ya. Baịbụl kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ndị isi ezinụlọ inye ndị ezinụlọ ha ihe ndị na-akpa ha. (1 Timoti 5:⁠8) Ọ gaghị adị mma ka onyeisi ezinụlọ na-enye ndị ọzọ ihe ruo nke na ọ ga-eleghara ndị ezinụlọ ya anya. Jizọs katọdịrị ndị na-achọghị inyere ndị mụrụ ha merela agadi aka n’ihi na ha na-ekwu na ihe niile ha nwere bụ “onyinye a raara nye Chineke.”​​—⁠Mak 7:​9-​13.

Amaokwu Baịbụl ndị kwuru maka inye ihe

Ilu 11:25: “Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba, onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.”

Ihe ọ pụtara: Inye ihe na-abara ma onye e nyere ihe ma onye nyere enye uru.

Ilu 19:17: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.”

Ihe ọ pụtara: Chineke weere ya na ya ji ndị na-enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka ụgwọ, o kwekwara nkwa na ya ga-akwụ ha ụgwọ ihe ọma ndị ha mere.

Matiu 6:2: “Mgbe ị na-enye onyinye ebere, afụla opi na-aga, dị nnọọ ka ndị ihu abụọ na-eme . . . ka ndị mmadụ wee nye ha otuto.”

Ihe ọ pụtara: Anyị ekwesịghị inye ihe ka ndị ọzọ wee hụ anyị.

Ọrụ Ndịozi 20:35: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”

Ihe ọ pụtara: Mmadụ isi n’obi nye ihe na-eme ka onye ahụ nwee obi ụtọ.

2 Ndị Kọrịnt 9:7: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”

Ihe ọ pụtara: Ọ na-atọ Chineke ụtọ ma mmadụ si n’obi ya nye ihe.

.​—Psalm 49:6, 7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya