27 Ọ bụrụ na anụmanụ e bu ụzọ mụọ bụ anụ na-adịghị ọcha, ya abụrụkwa na onye wetara ya chọrọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ.+ Ma ọ bụrụ na a zụrụghachighị ya, a ga-ere ya ọnụ ahịa ahụ e kwuru.