6 Ekish+ wee kpọọ Devid, sị ya: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụ iyi na ị bụ ezigbo mmadụ. Achọkwara m ka i soro mụ na ndị agha m gaa agha a,+ n’ihi na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m hụrụ i mere malite n’ụbọchị ị bịakwutere m ruo taa.+ Ma, ndị isi ndị ọzọ atụkwasịghị gị obi.+